Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 1:26 - Bible Nso

26 Anọm na nkpà n'ihi gi, nwa-nnem Jonatan: I di utọ nke-uku n'ebe m'nọ: Ihu-n'anya-gi nke i hurum di ebube, Kari ihu-n'anya ndinyom.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne m nʼihi na ihe dị oke ọnụahịa ka ị bụụrụ m. Ịhụnanya i nwere nʼebe m nọ dị omimi karịa ịhụnanya ndị nwanyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 1:26
7 Iomraidhean Croise  

Ndi-dike esiwo aṅa da! Ihe-agha esiwo aṅa la n'iyì!


Onye nēnwe ọtutu eyì nēnwe ha ibibi onwe-ya: Ma onye nāhu n'anya di nārapara n'aru kari nwa-nne.


Ma ihe Devid tọrọ Jonatan nwa Sọl utọ nke-uku. Jonatan we gosi Devid, si, Sọl, bú nnam, nāchọ ime ka i nwua: ma ub͕u a, biko, lezie onwe-gi anya n'ututu, nọdu n'ebe di nzuzo, zo onwe-gi:


Jonatan we me kwa ka Devid ṅua iyi ọzọ, n'ihi na ọ huru ya n'anya: n'ihi na dika ọ huru nkpuru-obi nke onwe-ya n'anya, otú a ka ọ huru Devid n'anya.


Mb͕e nwa-okoro ahu basiri n'obodo, Devid we si n'akuku Negeb bilie, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala ub͕ò atọ: ha we suturita onwe-ha ọnu, kwaritara onwe-ha ákwá, rue mb͕e Devid kwakariri ákwá.


Jonatan nwa Sọl we bilie, jekuru Devid n'oké ọhia ahu, me ka aka-ya di ike nime Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan