Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 1:2 - Bible Nso

2 o rue, nubọchi nke-atọ, na, le, otù nwoke siri n'ọmuma-ulo-ikwū puta, site n'ebe Sọl nọ, uwe-ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi n'isi-ya: o rue, mb͕e ọ biakutere Devid, na ọ daruru ala, we kpọ isi ala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 O ruo, nʼụbọchị nke atọ, otu nwoke si nʼọmụma ụlọ ikwu Sọl bịakwutere ya. Uwe nwoke a yi nʼahụ dọwara adọwa. Isi ya dịkwa aja aja. Ọ batara daa nʼala nʼihu Devid nʼọnọdụ inye ya nsọpụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 1:2
25 Iomraidhean Croise  

N'ubọchi nke-atọ Abraham weliri anya-ya abua, hu ebe ahu n'ebe di anya.


Reuben we biaghachi n'olùlù ahu; ma, le, Josef anọghi n'olùlù ahu; ọ we dọwa uwe-ya nile.


Jekob we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, yiri ákwà-nkpe n'úkwù-ya, ruru nwa-ya újú ọtutu ubọchi.


Ha si, Orù-gi, bú nna-ayi, nọ n'udo, ọ nọ kwa ndu. Ha we rube isi, kpọ isi ala.


Devid we si ya, Òle ebe i si bia? Ọ si ya, N'ọmuma-ulo-ikwū Israel ka m'wepugara onwem.


Tema we būru ntu n'isi-ya dọwa uwe-nwuda nwere aka nke di n'aru ya; ọ tukwasi aka-ya n'isi-ya, we la, nēje nēti nkpu.


Nwayi Tekoa we gwa eze okwu, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si, Zọputam eze.


O rue, na mb͕e Devid biaruru elu nrigo ahu, ebe ọ nākpọ isi ala nye Jehova, le, Hushai, bú onye-Akait, biara izute ya, ya na uwe-ya adọwara adọwa, na ájá n'elu isi-ya.


Arọna we le anya, hu eze na ndi-orù-ya ka ha nāgabigakute ya: Arọna we puta, kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala.


mb͕e otù onye nēgosim, si, Le, Sọl anwuwo, ma onye ahu n'anya ya onwe-ya di ka onye nēzi ozi ọma, m'we jide ya, b͕ue ya na Ziklag, nka bu ihe m'nyere ya bayere ozi ọma ahu.


Je, chikọta ndi-Ju nile ndi aganāchọta nime Shushan, nēbu-kwa-ranum ọnu, unu eri-kwa-la ihe, aṅu-kwa-la ihe-ọṅuṅu ubọchi atọ, abali na ehihie: mu onwem na umu-ab͕ọghọm gēbu kwa ọnu otú a; ma n'uzọ di otú a ka m'gābakuru eze, nke nādighi ka iwu si di: ma asi na alawom n'iyì, alawom n'iyì.


O rue, n'ubọchi nke-atọ, na Esta yiri uwe ala-eze ya, we guzo n'ogige di ime-ime nke ulo eze, na ncherita-iru ulo eze: ma eze nānọkwasi n'oche-eze ala-eze ya n'ulo ala-eze ya, na ncherita-iru ọnu-uzọ ulo ahu.


Sinu Chineke, Le ka ọlu-Gi nile si di oké egwu! N'uba nke ike-Gi ndi-iro-Gi gērube isi aghugho n'okpuru Gi.


me ka anuru olu-ha n'elu gi, tie nkpu ilu, kpokwasi ájá n'isi-ha, na ntu ka ha gāturu onwe-ha:


Ọ gēme ka ayi dighachi ndu mb͕e ubọchi abua gasiri: n'ubọchi nke-atọ ka Ọ gēme ka ayi bilie, ayi ewe di ndu n'iru Ya.


dọwa-kwa-nu obi-unu, adọwa-kwa-la uwe-unu, chigharikute Jehova, bú Chineke-unu: n'ihi na Onye-amara na Onye-obi ebere ka Ọ bu, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere, Ọ nēcheghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu Ọ gēweta.


n'ihi na dika Jona nọrọ ubọchi atọ ehihie na abali n'afọ oké anu miri; otú a Nwa nke madu gānọ n'obi nke ala ubọchi atọ ehihie na abali.


Site na mb͕e ahu Jisus Kraist malitere igosi ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ ghaghi ije Jerusalem, na ihu ọtutu ahuhu n'aka ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, na aghaghi ib͕u Ya, me kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubochi nke-atọ.


Joshua we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, da kpue iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova rue anyasi, ya onwe-ya na ndi-okenye Israel; ha we kpokwasi ájá n'isi-ha.


Le, anamenye ufọdu nime ulo-nzukọ, ahu nke Setan, nime ndi si na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha nēkwu okwu-ugha; le, M'gēme ka ha bia kpọ isi ala n'iru ukwu-gi, ka ha mara kwa na Mu onwem huru gi n'anya.


Mb͕e nwa-okoro ahu basiri n'obodo, Devid we si n'akuku Negeb bilie, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala ub͕ò atọ: ha we suturita onwe-ha ọnu, kwaritara onwe-ha ákwá, rue mb͕e Devid kwakariri ákwá.


Abigail we hu Devid, me ngwa, si n'inyinya-ibu-ya rida, da kpue iru-ya n'ala n'iru Devid, kpọ isi ala.


Otù nwoke onye Benjamin we si n'usoro agha ahu b͕a ọsọ, biarue Shailo n'ubọchi ahu, uwe nwuda ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi ya n'isi.


Nwoke ahu we si Ilai, Mu onwem bu onye si n'usoro agha bia, mu onwem si kwa n'usoro agha b͕alaga ta. O we si, Gini bu ihe emere, nwam?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan