Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 1:12 - Bible Nso

12 Ha we tie aka n'obi, kwa ákwá, bue ọnu rue anyasi, n'ihi Sọl, na n'ihi Jonatan nwa-ya, na n'ihi ndi Jehova, na n'ihi ulo Israel; n'ihi na ha dara site na mma-agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ha ruru ụjụ. Kwaa akwa. Bukwaa ọnụ ruo oge anyasị nʼihi Sọl na Jonatan nwa ya nwoke, na nʼihi ndị agha Onyenwe anyị na ụlọ Izrel. Nʼihi na ha dara site na mma agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 1:12
10 Iomraidhean Croise  

Ndi ahu nile we bia ime ka Devid rie nri mb͕e ubọchi fọduru; ma Devid ṅuru iyi, si, Chineke mem otú a, me kwa ihe ọzọ otú a, ọ buru na edetum nri ọnu, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ, tutu ọdida-anyanwu.


Aṅurila mb͕e onye-iro-gi nāda, Ka obi-gi ghara kwa iteghari egwú ọṅù mb͕e ọ nāsu ngọngọ:


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na isim bu miri miri, asi anyam abua bu isi-iyi nke anya-miri, ka m'we kwa ákwá n'ehihie na abali bayere ndi eb͕uru eb͕u nke ada ndim!


ndi nāṅu manya-vine n'ọkwa-nwusa, ọ bu kwa manu kachasi nma ka ha ji ete onwe-ha; ma ha ariaghi ọria n'ihi nkpaji akpajiri Josef.


ma Mu onwem si unu, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsob͕u unu;


Ònye nādighi ike, nke mu onwem nēsoghi ya n'adighi-ike? ònye ka anēme ka ọ ma n'ọnyà, nke mu onwem nēreghi ọku n'ihi ya?


Ma n'ikpe-azu, nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna-unu n'anya, ndi nwere obi ọmiko, ndi nwere uche di ume-ala:


Ha we chiri ọkpukpu-ha, lìe ha n'okpuru osisi tamarisk nime Jebesh, bue ọnu ubọchi asa.


Sọl we nwua, ya na umu-ya ndikom atọ na onye nēbu ihe-agha-ya na ndikom-ya nile n'otù, n'ubọchi ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan