Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Pita 3:11 - Bible Nso

11 Ebe anēme ka ihe ndia nile la n'iyì otú a, ọ̀ bu aha madu gini ka unu nāghaghi ibu n'ibi-obi nsọ nile na nsọpuru-Chineke nile,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ebe ọ bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri ị na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Pita 3:11
27 Iomraidhean Croise  

Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya; Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da, Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha:


Onye nāchu ekele dika àjà nāsọpurum; Ọ bu kwa onye nēdozi uzọ-ya Ka m'gēme ka ọ hu nzọputa Chineke.


Ndi gbazeworo agbaze ka uwa na ndi nile ndi bi nime ya bu: Mu onwem atùwo ogidi nile ya. Selah


Kwasie ákwá ike, gi ọnu-uzọ-ama; tie nkpu, gi obodo; i b͕azewo, Filistia, ka i ra; n'ihi na n'Ugwu ka anwuru-ọku si bia, ọ dighi kwa onye ọ bula nēguzo iche na mb͕e-ya nile akara àkà.


Anyajisiwo uwa, emebisiwo uwa, ewezugasiwo uwa n'ọnọdu-ya.


Usu nile nke ihe elu-igwe gēdè kwa, agāpiakọta kwa elu-igwe dika akwukwọ-odide: usu-ha nile gākpọnwu kwa, dika akwukwọ si akpọnwu dapu n'osisi vine, na dika akwukwọ nke nākpọnwu akpọnwu si adapu n'osisi fig.


Ibobo we nwua ndi ahu n'aru, ha si, Àha madu gini ka Onye a bu, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?


Nke ahu kwa, ebe unu matara oge a, na oge hour eruwo ub͕u a ka unu teta n'ura: n'ihi na ub͕u a nzọputa-ayi di nso kari mb͕e ayi kwere na mbu.


Chi ejimiwo, chi-ọbubọ di kwa nso: ya mere ka ayi yipu ọlu nile nke ọchichiri, ma ka ayi yikwasi ihe-agha nke ihè.


N'ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n'idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n'amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n'amara Chineke, ka ayi biri obi n'uwa, ma ọ bu n'ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.


Nání nēbinu obi dika ndi ala elu-igwe n'uzọ kwesiri ozi ọma nke Kraist: ka ọ gābu, ma m'bia hu unu ma-ọbu na anọghm, ka m'we nu ihe bayere ọnọdu-unu, na unu nēguzosi ike n'otù Mọ Nsọ, nēwere kwa otù nkpuru-obi lukọrọ okwukwe nke ozi ọma ahu ọ̀gù si-ike;


N'ihi na ala-ayi di n'elu-igwe ub͕u a; site n'ebe ayi nēchesi kwa Onye-nzọputa ike, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist:


na ọ bughi nání n'okwu-ọnu ka ozi ọma ayi biaruru unu, kama ọ bia-kwa-ra n'ike, na nime Mọ Nsọ na ọtutu nkwezu; dika unu matara aha madu a huru na ayi bu n'ebe unu nọ n'ihi unu.


Ọ bu kwa ihe anēkwuputa na ọ di uku, bú ihe-omimi nke nsọpuru-Chineke; Onye ahu Nke emere ka Ọ puta ìhè n'anu-aru, Nke aguru Ya n'onye ezi omume nime mọ, Nke emere ka ndi-mọ-ozi hu Ya anya, Nke ekwusara Ya n'etiti ndi mba ọzọ, Nke ekwere na Ya nime uwa, Nke anara Ya n'elu nime ebube.


Ekwela ka onye ọ bula lelìa nwata i bu anya; kama me onwe-gi ka i buru ndi kwere ekwe ihe-atù, n'okwu, n'ibi-obi, n'ihu-n'anya, n'okwukwe, n'idi-ọcha.


Ma gi onwe-gi, onye nke Chineke, nāb͕anari ihe ndia; ma nāb͕aso ezi omume, nsọpuru-Chineke, okwukwe, ihu-n'anya, ntachi-obi, idi-nwayọ.


Ọ buru na onye ọ bula nēzí ihe di iche, nēkweyeghi kwa n'okwu nēnye ezi ndu, bú okwu nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ozizí ahu nke di ka nsọpuru-Chineke si di;


Ma nsọpuru-Chineke, ya na inwezu ihe nile di nkpà, bu uzọ irita urù nke-uku;


Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli.


n'ihi na o kiriri onwe-ya, ọ puwo kwa, ngwa ngwa o we chezọ aha madu ọ bu.


Ònye bu onye-amam-ihe nke nāghọta kwa ihe n'etiti unu? ya site n'ibi-obi ọma ya gosi ọlu-ya nile nime idi-nwayọ nke amam-ihe.


kama dika Onye kpọrọ unu di nsọ, unu onwe-unu, ghọ-kwa-nu ndi di nsọ n'ibi-obi nile di iche iche;


nēbinu obi-unu nke-ọma n'etiti ndi mba ọzọ; ka ha we site n'ọlu ọma nile unu, nke ha nēle anya, nye Chineke otuto n'ubọchi nleta ahu nime ihe ahu ha nēkwutọ unu nime ya dika ndi nēme ihe ọjọ.


dika ike O ji buru Chineke nyeworo n'aka-ayi ihe nile di ndu na nsọpuru-Chineke n'efu, site na nmazu nke Onye ahu Onye ji ebube na idi-nma nke aka Ya kpọ ayi;


nyezu kwa ijisi-onwe-unu-ike n'ihe-ọmuma-unu; nyezu kwa ntachi-obi n'ijisi-onwe-unu-ike; nyezu kwa nsọpuru-Chineke nime ntachi-obi-unu;


Ma ubọchi Onye-nwe-ayi gābia dika onye-ori; nke ọ bu nime ya ka elu-igwe gēji oké ùzù gabiga, ihe nile di n'elu-igwe gāb͕a kwa ọku we la n'iyì, uwa na ọlu nile aluru nime ya gērechapu kwa.


nēle anya ọbibia nke ubọchi ahu nke Chineke, nēme kwa ka ọ bia ngwa ngwa, nke elu-igwe gēre ọku we la n'iyì n'ihi ya, ihe nile di n'elu-igwe gāb͕a kwa ọku we b͕aze?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan