Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Pita 2:8 - Bible Nso

8 (n'ihi na onye ezi omume ahu, ebe o nēbi n'etiti ha, o were ọlu-ha nke nēmebi iwu mekpa nkpuru-obi ezi omume ya aru kwa-ubọchi, n'ile ihe na inu ihe):

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 (nʼihi na nwoke ezi omume ahụ nke na-ebi nʼetiti ha ụbọchị niile, ehihie na abalị, bụ onye eji ọrụ mmebi iwu niile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, mekpaa mkpụrụobi ezi omume ya ahụ).

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Pita 2:8
12 Iomraidhean Croise  

Ma ndi Sọdọm bu ndi ọjọ na ndi-nmehie megide Jehova nke-uku.


Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua, N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi.


Ekworom ekpochapuwom, N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile.


Ahurum ndi nāghọb͕u nghọb͕u, m'we sọ ha oyi; N'ihi na ha edebeghi okwu-ọnu-Gi.


Isi-iyi azọtọrọ azọtọ na ebe-nsuputa-miri bibiri ebibi Ka onye ezi omume nke anēwezuga n'ọnọdu-ya n'iru onye nēmebi iwu bu.


Mb͕e obi ndi ezi omume nātọ ha utọ, ọtutu ima-nma di: Ma mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, agāchọ madu achọ.


Jehova we si ya, Gabiga n'etiti obodo a, n'etiti Jerusalem, ka akàrà n'egedege-iru nke ndi ahu ndi nēze ume ndi nāsu kwa ude n'ihi ihe-árú nile nke anēme n'etiti ya.


b͕usisianu okenye na okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke na umu-ntakiri na ndinyom: ma unu abiarula nso onye ọ bula nke akàrà ahu di ya n'iru; ma n'ebe nsọm ka unu gēsi malite. Ha we malite n'etiti ndi-okenye ndi nọ n'iru ulo ahu.


ebe ọ matara nka, na adighi-enye onye ezi omume iwu, kama anēnye ndi nēmebi iwu, ndi nēkweghi kwa idi n'okpuru iwu, nye ndi nāsọpurughi Chineke, ndi bu kwa ndi-nmehie, nye ndi nādighi ọcha n'obi, ndi emeru-kwa-ra emeru, nye ndi nēb͕u nna-ha na ndi nēb͕u nne-ha, nye ndi nēb͕u madu,


Okwukwe ka Ebel ji che àjà n'iru Chineke nke ka àjà Kain chere nma, nke esitere na ya b͕ara ya àmà na ọ bu onye ezi omume, ebe Chineke b͕ara àmà bayere onyinye-ya nile: o site kwa na nke ahu nēkwu okwu ub͕u a, ọ bu ezie na ọ nwuru anwu.


Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan