Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Pita 2:20 - Bible Nso

20 N'ihi na asi na, mb͕e ha b͕anariworo ihe nile emeruru emeru nke uwa site na nmazu nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist, ewe nime ihe ndia, meri kwa ha, ọnọdu ikpe-azu ha abiawo jọkari ọnọdu mbu njọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Mgbe ha sitere nʼihe niile emerụrụ emerụ nke ụwa gbapụ, site na mmazu nke Onyenwe anyị, na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, bụrụ ndị atụhịrị na mmehie ọzọ, bụrụkwa ndị e meriri, ha ga-abụ ndị ọnọdụ ha ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Pita 2:20
20 Iomraidhean Croise  

Mb͕e M'nāsi onye ezi omume, na ọ ghaghi idi ndu, onye ahu ewe tukwasi obi n'ezi omume-ya, me ajọ omume, ezi omume-ya nile, agaghi-echeta ha; ma n'ajọ omume-ya nke o meworo, nime ya ka ọ gānwu.


onye-nchu-àjà gāhu kwa ya, ma, le, ọ buru na ọ di ala, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, aji-ya ab͕anwewo kwa ọcha, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu, n'ihe-ofifi ahu ka ọ b͕awaputaworo.


onye-nchu-àjà gāhu kwa, mb͕e asuchasiri ihe-otiti ahu: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anweghi iru-ya, ọ buru kwa na ihe-otiti ahu abaghi aba, ihe ruru árú ka ọ bu; n'ọku ka i gēsure ya: ekpenta ka ọ bu, ma ọ bu n'isi-nkwọcha-ya ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha.


Ma ọ buru na ihe-otiti ahu alaghachi, b͕awaputa n'ulo ahu, mb͕e ọ dọpusiri nkume ahu, mb͕e ọ kpuchasi-kwa-ra ulo ahu, mb͕e etesi-kwa-ra ya;


Ọ we hu Amalek, we tua ilu-ya, si, Mba mbu nke mba nile ka Amalek bu; Ma ikpe-azu-ya gābiaru ila-n'iyì.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka, Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha!


ndi ọgwugwu-ha bu ila-n'iyì, ndi chi-ha bu afọ-ha, ndi otuto-ha di kwa n'ihere-ha, ndi nātukwasi uche n'ihe uwa.


Ọ dighi onye-agha ọ bula nātuhi onwe-ya n'ihe nke ibi-obi a mb͕e o nēbu agha; ka o we me ihe gātọ onye dere aha-ya n'akwukwọ dika onye-agha.


Okpukpe-Chineke nke di ọcha nke anēmerughi kwa emeru n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, bu nka, ileta umu-nb͕ei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpab͕u-ha, na idebe onwe-ya nēnweghi ntupọ site n'uwa.


n'ihi na otú a ka agēnyezu unu n'àkù nbata ahu unu gābata nime ala-eze ebighi-ebi nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist.


Ka eme ka amara bara unu uba, ya na udo, nime nmazu nke Chineke na nke Jisus Onye-nwe-ayi;


dika ike O ji buru Chineke nyeworo n'aka-ayi ihe nile di ndu na nsọpuru-Chineke n'efu, site na nmazu nke Onye ahu Onye ji ebube na idi-nma nke aka Ya kpọ ayi;


bú nke O siteworo nye n'aka-ayi nkwa nile ahu di oké ọnu-ahia di kwa uku ri nne; ka unu we site n'ihe ndia ghọ ndi nēnwekọ ihe O ji buru Chineke, ebe unu b͕anariworo nmebi nke di n'uwa site n'agu ihe ọjọ.


N'ihi na asi na unu nwere ihe ndia, asi kwa na unu nwere ha ri nne, ha nēdo unu ndi nābughi ndi nādighi-alu ọlu ma-ọbu ndi nādighi-ami nkpuru rue imazu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.


N'ihi na, ebe ha nēkwu oké okwu na mbuli elu nke ihe-efu, ha were agu ikwa-iko di iche iche nārafu ndi ahu nime agu ihe ọjọ nke anu-aru, bú ndi nāb͕anari n'oge ub͕u a ndi nēbi obi na njehie;


Ma nābanu uba n'amara na ọmuma nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist. Ọ bu Ya ka otuto diri ma ub͕u a ma rue ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi. Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan