Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Pita 2:15 - Bible Nso

15 ha rapuru uzọ guzosiri ike eguzo, we jehie, ebe ha soro uzọ Belam nwa nke Beoa, onye huru ugwọ-ọlu nke ajọ omume n'anya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ha esitela nʼezi ụzọ ahụ jehie, soro omume Belam nwa Beoa, onye hụrụ ụgwọ ọrụ nke ajọ omume nʼanya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Pita 2:15
21 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Emekpaghm Israel aru; kama ọ bu gi onwe-gi, na ulo nna-gi, nime nrapu unu rapuworo ihe nile Jehova nyere n'iwu, i we jeso Bealim.


Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi: ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya.


n'ihi na ha ejighi achicha na miri bia n'iru umu Israel, kama ha gotara Belam imegide ha, ikọcha ha: ma Chineke-ayi b͕anwere nkọcha ahu ka ọ ghọ ngọzi.


Ndi nārapu iwu nēto onye nēmebi iwu, Ma ndi nēdebe iwu nāluso ha ọ̀gù.


Ma Mu onwem kwa, anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko, uzọ-ha ka M'gētiyekwasi n'isi-ha.


Efraim gāsi, Gini ka mu na arusi di iche iche nwekọrọ ọzọ? Mu onwem azawo, M'gēlegide kwa ya anya: mu onwem di ka osisi di ndu; esi nam chọta nkpuru-gi.


Ndim, biko, cheta ihe Belak, bú eze Moab, b͕ara n'ìzù, na ihe Belam nwa Beoa zara ya; cheta site na Shitim rue Gilgal, ka unu we mara ezi omume nile nke Jehova.


Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova ka o nēguzo n'uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n'aka-ya: nne-inyinya-ibu ahu we wezuga onwe-ya n'uzọ, je n'ọhia: Belam we tie nne-inyinya-ibu ahu ihe, iwezuga ya ba n'uzọ.


Jehova we saghe ọnu nne-inyinya-ibu ahu, ọ we si Belam, Gini ka m'meworo gi, na itiwom ihe ub͕ò atọ ndia?


Mọ-ozi nke Jehova we si ya, N'ìhi gini ka i tiworo nne-inyinya-ibu-gi ihe ub͕ò atọ ndia? le, mu onwem aputawo ibu onye-nmegide, n'ihi na uzọ-gi nārida na nbibi n'irum:


Le, ndia buru umu Israel, n'okwu-ọnu Belam, ihe nēweta nmekpu megide Jehova n'okwu Peoa, ihe-otiti ahu we di n'etiti nzukọ Jehova.


N'ihi na apuru ire manu-otite a oké ọnu-ahia, we nye ndi-ob͕eye.


(Ya mere onye a sitere n'ugwọ-ọlu nke ajọ omume-ya nata otù iberibe ala; o we da su isi n'ala, tipue afọ-ya, ngiri-afọ-ya nile we nuputa.


si, Gi onye juputara n'aghughọ nile na ihe nile jọb͕uru onwe-ya, gi nwa ekwensu, gi onye-iro ezi omume nile, ì gaghi-arapu ikwahie uzọ nile eguzoziri nke Onye-nwe-ayi?


ndi anēmejọ ha dika ugwọ-ọlu nke ajọ omume; madu ndi nāgu ya n'ihe-utọ, bú ibi n'oké oriri na oké ọṅuṅu n'ehihie, ndi bu ntupọ na ihe-ita-uta, nānọ n'oké oriri na oké ọṅuṅu n'oriri ihu-n'anya ha mb͕e ha nēso unu rikọ ihe;


Ahuhu gādiri ha, n'ihi na ha gara n'uzọ Ken, wusì kwa onwe-ha dika miri na njehie nke Belam n'ihi ugwọ-ọlu, we la n'iyì na nkwugide nke Kora.


Ma enwerem ihe ole-na-ole imegide gi, n'ihi na i nwere n'ebe ahu ufọdu ndi nējidesi ozizí Belam ike, bú onye nēzí Belak itọb͕ọ n'iru umu Israel ihe-ima-n'ọnyà, ka ha rie ihe achuru n'àjà nye arusi, ka ha kwa kwa iko.


Mu onwem kwa, ya burum ihe-árú, bú ka m'mehie megide Jehova n'igha ikpe ekpere bayere unu: ma m'gēzí unu ihe n'uzọ ahu di nma nke ziri ezi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan