Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Pita 2:12 - Bible Nso

12 Ma ndia, dika anu nēnweghi uche, ndi bu anu nzuzu site n'ọmumu-ha inwude na imebi, nēkwulu Chineke n'ihe ha nāmaghi, agēmebi kwa ndia na nmehie ha,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Lee ka ha si na-ekwulu ihe ndị ha aghọtaghị. Ha dị ka ụmụ anụ ọhịa, ndị nzuzu na-eme naanị ihe ọbụla ha kpebiri nʼobi ha. Ndị a mụrụ naanị maka ijide ha ma bibiekwa ha. A ga-egbu ha otu e si egbu ụmụ anụ ọhịa ndị a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Pita 2:12
17 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ọ gāhu ya: ndi-amam-ihe gānwu, N'otù ka onye-nzuzu na onye bu anu-ọhia nālakọ n'iyì, We rapuru ndi ọzọ àkù-ha.


Madu nke bu anu-ọhia adighi-ama ama; Onye-nzuzu adighi-aghọta kwa nka:


Ghọtanu, unu ndi bu anu-ọhia n'etiti ndi Israel: Unu ndi-nzuzu kwa, òle mb͕e unu gēnwe uche?


Anenupu onye nēmebi iwu n'ihe ọjọ ya: Ma onye nwere ebe-nb͕abà n'ọnwu-ya ka onye ezi omume bu.


N'ihi na ndi-ọzùzù-aturu aghọwo anu-ọhia, ma Jehova ka ha nājughi ase: n'ihi nka ha enweghi uche, aturu nile ha nāzù we b͕asa.


Ma ha nile n'otù bu anu-ọhia na ndi-nzuzu: idọ-aka-na-nti nke ihe-efu, nání osisi ka ọ bu.


Ma Gi onwe-gi maram, Jehova; I nāhum, nwa kwa nkpuru-obim n'ebe I nọ: dọkpupu ha dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, do ha nsọ nye ubọchi ob͕ub͕u.


N'ihi na ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ ka ndim bu, Mu ka ha nāmaghi; umu di nzuzu ka ha bu, ndi nādighi-aghọta ihe ka ha bu: ndi mara ihe ka ha bu n'ime ihe ọjọ, ma ime ezi ihe ka ha nāmaghi.


Mu onwem we si, N'ezie ndi nēnweghi ike ka ha bu: ha b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha; n'ihi na ha amaghi uzọ Jehova, na ikpé nke Chineke-ha:


M'gāwukwasi gi ajọ iwem; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'gēji fùkwasi gi: M'gēnye kwa gi n'aka ndikom bu nání anu-ọhia, ndi di ǹkà n'ibibi ebibi.


ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche:


Ya mere Ọ siri ha ọzọ, Mu onwem nāla, unu gāchọkwam, unu gānwu kwa na nmehie-unu: ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia.


N'ihi na onye nāgha nkpuru nye anu-aru onwe-ya gēsite n'anu-aru ahu weta nmebi dika ihe-ubi; ma onye nāgha nkpuru nye Mọ Nsọ gēsite na Mọ Nsọ weta ndu ebighi-ebi dika ihe-ubi


(bú ihe agēmebi ha nile emebi n'iji ha me ihe), dika ihe enyere n'iwu na ozizí madu si di?


bú nke O siteworo nye n'aka-ayi nkwa nile ahu di oké ọnu-ahia di kwa uku ri nne; ka unu we site n'ihe ndia ghọ ndi nēnwekọ ihe O ji buru Chineke, ebe unu b͕anariworo nmebi nke di n'uwa site n'agu ihe ọjọ.


ha nēkwe kwa ha nkwa na ha gēnwe onwe-ha, ọ bu ezie na ha onwe-ha bu orù nke nmehie; n'ihi na ihe meriworo madu, ihe a ka emewo-kwa-ra ka onye ahu buru orù-ya.


Ma ndia nēkwulu ihe nile, ka ha ra, bú ihe ha nāmatagh: ma ka ha ra, bú ihe ha nāghọta site n'ọmumu, dika anu nēnweghi uche, nime ihe ndia ka anēmebi ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan