Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 9:13 - Bible Nso

13 ebe ha ji nnwaputa nke ije-ozi a nēnye Chineke otuto n'ihi na edoro nkwuputa-unu n'okpuru ozi ọma Kraist, ya na n'ihi afọ-ofufo nke nnwekọ unu nēme ka ha na madu nile so unu nēnwekọ;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Nʼihi ije ozi a, nke unu sitere na ya gosi onwe unu dịka ndị kwesiri, ndị ọzọ ga-eto Chineke nʼihi irube isi unu nke dakọtara na nkwupụta unu banyere oziọma nke Kraịst, ya na onyinye afọ ofufu nke unu na-eme ka ha na ndị ọzọ niile soro unu nwekọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 9:13
27 Iomraidhean Croise  

Onye nāchu ekele dika àjà nāsọpurum; Ọ bu kwa onye nēdozi uzọ-ya Ka m'gēme ka ọ hu nzọputa Chineke.


Otú a menu ka ìhè-unu nēnwu n'iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna-unu Nke bi n'elu-igwe.


Ma mb͕e ìgwè madu nile huru ya, ha turu egwu, we nye Chineke otuto, Onye nyere madu ike di otú a.


Ma gini mere unu nākpọm, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, ma unu emeghi ihe nile M'kwuru?


Nime nka ka anēnye Nnam otuto, ka unu nāmi nkpuru ri nne; unu gābu kwa ndi nēso uzọm.


Ma mb͕e ha nuru ihe ndia, ha kpuchiri ọnu-ha, we nye Chineke otuto, si, Ya mere ọ bu kwa ndi mba ọzọ ka Chineke nyere nchèghari nke nēdubà na ndu.


Ma mb͕e ha basiri ha nba ọzọ, ha rapu ha ka ha la, ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi me ka ha hu ahuhu-nmehie, n'ihi ndi-Ju; n'ihi na madu nile nēnye Chineke otuto bayere ihe emeworo.


Ma ọ bughi ha nile ṅara ozi ọma ahu nti. N'ihi na Aisaia nāsi, Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo?


ma-ọbu onye nākasi obi, ya nọ na nkasi-obi-ya: onye nēme ka ndi ọzọ keta ihe o nwere, ya were afọ-ofufo me ya; onye bu onye-isi, ya were obi nānu ọku nābu isi; onye nēme ebere, ya were obi-utọ me ya.


Ka ewe dọputam n'aka ndi nēkweyeghi ekwenye ndi nọ na Judia, ka ije-ozim nke m'ji je Jerusalem we búru kwa ihe ndi nsọ gānara nke-ọma;


ma ub͕u a ka emere ka ọ puta ìhè, esite kwa n'ihe ndi-amuma deworo n'akwukwọ me ka mba nile mara ya, dika ihe Chineke ebighi-ebi nyere n'iwu si di, rue iṅa-nti nke okwukwe;


ebe ayi nēweda ihe anātule n'obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n'agha iṅa nti Kraist;


Ma mb͕e m'biaruru Troas izisa ozi ọma Kraist, mb͕e emeghereri kwa ọnu-uzọ nime Onye-nwe-ayi nyem,


ha were ọtutu aririọ nāriọ ayi ka ayi nye ha amara nka na nnwekọ ije-ozi anējere ndi nsọ:


ha onwe-ha kwa, n'aririọ-ha n'ihi unu, nāgusi unu ike n'ihi amara Chineke di nime unu nke kariri nke-uku.


ha we nēnye Chineke otuto n'ihe ha huru n'arum.


Nāb͕asi nb͕a ọma nke okwukwe ike, jide ndu ebighi-ebi aka nke akpọrọ gi ka i nata ya, i kwuputa-kwa-ra nkwuputa ọma ahu n'iru ọtutu ndi-àmà.


Anamenye gi iwu n'iru Chineke, Onye nēme ka ihe nile di ndu, ya na n'iru Kraist Jisus, Onye b͕ara àmà nkwuputa ọma ahu n'iru Pọntiọs Pailat;


ka ayi jidesie nkwuputa nke olile-anya-ayi ike ka ọ ghara iruda n'ala; n'ihi na Onye ahu Nke kwere nkwa kwesiri ntukwasi-obi:


Ma unu echezọla ime ihe di nma na ime ka unu na ndi ọzọ nwekọ ihe-unu: n'ihi na àjà di otú a nātọ Chineke ezi utọ.


Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;


Ya mere ebe ayi nwere Onye-isi-nchu-àjà di uku, Onye gabigaworo eluigwe nile, bú Jisus Ọkpara Chineke, ka ayi jidesie nkwuputa-ayi ike.


ebe emesiri Ya ka O zue okè, O we ghọrọ ndi nile nāṅa Ya nti Onye nēwetara ha nzọputa ebighi-ebi;


Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube:


ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Nne di-ya we si ya, #Ole ebe i chikọtaworo ọka ta? #_O bu kwa ole ebe i luru ọlu? ka onye n=amata gi buru onye agọziri agọzi. O we gosi nne di-ya onye ọ luru ọlu n>ubi-ya, si, Aha nwoke ahu onye m>luru ọlu n>ubi-ya ta bu Boaz.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan