Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 9:11 - Bible Nso

11 ebe anēme ka unu buru ọgaranya n'ihe nile ọ bula rue afọ-ofufo nile, nke sitere n'aka-ayi nāluputa ekele anēkele Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ọ ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya nʼụzọ niile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe niile. Site nʼaka anyị, afọ ofufu unu ga-enye Chineke ekele nʼihi inyeaka unu nyere ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 9:11
15 Iomraidhean Croise  

Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, nke ulo Zedok, we gwa ya, si, Site na mb͕e ha malitere ibubata àjà-nbuli n'ulo Jehova, ayi erijuwo afọ, rifọ kwa ihe n'uba: n'ihi na Jehova agọziwo ndi-Ya; ma nke fọduru bu ọtutu ihe nile a.


Ò zighi ezi n'iwu ka m'were ihe nile nkem me ihe m'nāchọ? ma-ọbu ànya-gi jọrọ njọ, n'ihi na mu onwem bu ezi madu?


Otú ahu onye nara talent abua ahu rita-kwa-ra talent abua ọzọ.


ma-ọbu onye nākasi obi, ya nọ na nkasi-obi-ya: onye nēme ka ndi ọzọ keta ihe o nwere, ya were afọ-ofufo me ya; onye bu onye-isi, ya were obi nānu ọku nābu isi; onye nēme ebere, ya were obi-utọ me ya.


na n'ihe nile ọ bula emere unu ndi-ọgaranya nime Ya, n'okwu nile na ọmuma nile;


ebe unu nēyekọ kwa aka n'ihi ayi n'aririọ-unu; ka ọtutu madu we kele ekele n'ihi ayi bayere onyinye-amara enyeworo ayi site n'aka ọtutu madu.


N'ihi na ihe nile di n'ihi unu, ka amara, ebe o riri nne site n'aka ndi ka n'ọnu-ọgugu, ka o we me ka ikele-ekele babiga ókè rue ebube nke Chineke.


Ma ekele diri Chineke, Onye nētiye otù inu-ọku ahu n'ihi unu n'obi Taitọs.


ma ọ bughi nání otú a, kama nzukọ Kraist nile rọputa-kwa-ra ya ka ọ nēso ayi n'ije ije n'amara nka, nke ayi nēje ozi ya inye Onye-nwe-ayi otuto, na igosi obi di ọku nke ayi:


N'ihi na ije-ozi nke ifè-òfùfè a abughi nání ihe nēmezu ihe fọduru ndi nsọ inwe, kama o site-kwa-ra n'ọtutu ekele anēkele Chineke we babiga ókè;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan