Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 8:8 - Bible Nso

8 Ekwughm n'uzọ inye iwu, kama n'iwere inu-ọku-n'obi nke ndi ọzọ nwaputa kwa ihu-n'anya-unu na ọ bu ezi ihu-n'anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Anaghị m enye unu iwu, kama site nʼizi unu otu o si na-anụ ndị ọzọ ọkụ nʼobi inyeaka, achọrọ m ịchọpụta ma ịhụnanya unu na ịnụ ọkụ nʼobi unu ọ ga-adakọtakwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 8:8
19 Iomraidhean Croise  

Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.


Ka ihu-n'anya buru ihe nke iru-abua nādighi nime ya. Nākpọnu ajọ ihe asì; nārapara ezi ihe n'aru.


Ma ọ bu mu onwem, ọ bughi Onye-nwe-ayi, nāsi ndi fọduru: Ọ buru na nwa-nna ọ bula nwere nwunye nēkweghi ekwe, ọ buru kwa na ọ di nwanyi ahu ezi nma ka ya na ya biri, ka di-ya ghara irapu ya.


Ma enweghi m ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu bayere umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ma enyem ìzùm, dika onye Onye-nwe-ayi meworo ebere ka m'buru onye kwesiri ntukwasi-obi.


Ma anamekwu nka n'uzọ nkweye, ọ bughi n'uzọ ihe enyere n'iwu.


nime idi-ọcha, nime ihe-ọmuma, nime ogologo ntachi-obi, nime obi-ọma, nime Mọ Nsọ, nime ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya,


Na nka ka m'nēnye kwa ìzùm: n'ihi na nka nābara unu urù, madu ndi buru uzọ malite n'arọ gara aga, ọ bughi nání ime eme, kama ichọ kwa achọ.


Ya mere nēgosinu ha n'iru nzukọ Kraist nile ihe gēgosi ihu-n'anya-unu na inya-isi-ayi bayere unu.


n'ihi na amataram obi di ọku unu, nke m'nānyara ndi Masedọnia isi bayere unu, na Akaia akwadebewo n'arọ gara aga; inu-ọku-unu kwali-kwa-ra obi ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha.


Ka onye ọ bula n'etiti unu nye dika o buru uzọ rọputa n'obi-ya; ọ bughi site na nwuta, ma-ọbu site na nkpà: n'ihi na Chineke huru onye were obi-utọ nēnye n'anya.


kama ka ayi we nēso ezi-okwu nime ihu-n'anya, we tó etó rue nime Ya n'ihe nile, Onye bu isi-ayi, bú Kraist;


Ka amara diyere ndi nile huru Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n'anya n'emebighi-emebi.


ka ayi nātugharita kwa uche n'aru ibe-ayi ikpasu ihu-n'anya na ọlu ọma di iche iche;


Ma ub͕u a, nātunu egwu Jehova, nēfè-kwa-nu Ya òfùfè n'izu-okè na ezi-okwu: wezuga-kwa-nu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè n'ofè Osimiri ahu, na n'Ijipt; ma fènu Jehova òfùfè.


Ebe unu meworo nkpuru-obi-unu ka ha di ọcha n'iṅa-nti nke unu ṅara ezi-okwu, iwere ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya hu umu-nna-unu n'anya, sitenu n'obi-unu hurita onwe-unu n'anya si-ike:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan