Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 8:3 - Bible Nso

3 N'ihi na ka ike-ha ra, dika m'nāb͕a àmà, e, kari kwa ike-ha, ka ha nyere dika ha zuputara n'onwe-ha,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ana m agba ama na ha nyere dịka ike ha, ha nyekwara ọ bụladị karịa otu a tụrụ anya. Onyinye ha si nʼobi ha pụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 8:3
22 Iomraidhean Croise  

Ndi Israel we ṅuria ọṅu, n'ihi na ha were afọ-ofufo nye onwe-ha, n'ihi na n'obi zuru okè ka ha were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ha: ọzọ kwa, Devid, bú eze, ṅuriri ọṅu uku.


Ndi-gi bu onyinye-afọ-ofufo n'ubọchi usu-ndi-agha-gi; N'ima-nma nile nke idi-nsọ, site n'afọ nke ututu; Gi nwe igirigi, bú umu-okorọbia-gi.


Nwoke ọ bula na nwayi ọ bula, ndi obi-ha mere ka ha nwe afọ-ofufo iweta ihe iji je ozi nile, nke Jehova nyere iwu ka eme n'aka Moses, umu Israel ahu wetara onyinye afọ-ofufo nye Jehova.


Sinu n'etiti unu wetara Jehova àjà-nbuli: onye ọ bula nke obi-ya nwere afọ-ofufo, ya weta ya, bú àjà-nbuli nke Jehova; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla;


O mere ihe ọ nwere ike ime: o buru uzọ te arum manu-otite ka ewe doziem n'olìlì.


Ndi nēso uzọ Jisus, onye ọ bula ka ihe o nwere ra, we zube izigara umu-nna nime Kraist ndi bi na Judia ihe iyere ha aka:


N'ihi na anamab͕ara ha àmà na ha nānu ọku n'obi n'ebe Chineke nọ, ma ọ bughi dika nmazu si di.


Kwa ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa ka unu nile n'otù n'otù debe ihe n'ulo nākpado ya, otú ihe nāgara onye ọ bula nke-ọma, ka aghara inara ùtú mb͕e ọ bula m'gābia.


N'ihi na asi na emem ihe a ebe m'nāchọ ime ya, enwerem ugwọ-ọlu: ma ọ buru na emem ya mb͕e m'nāchọghi ime ya, ewerewo ntukwasi-obi nye ọchichi-èzí-na-ulo n'akam.


Òle ebe ọ di kwa, bú ọkpukpọ unu nākpọ onwe-unu ndi ngọzi diri? n'ihi na ab͕aram unu àmà, na, ọ buru na ọ bu ihe unu puru ime, unu gāghuputawori anya-unu nyem.


n'ihi na ọ bu Chineke Onye nālusi ọlu ike nime unu ichọ-achọ-unu na ilusi-ọlu-ike-unu, n'ihi na ọ di Ya ezi nma.


N'ihi na anamab͕ara ya àmà, na ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nke-uku nye unu na ndi nọ na Leọdisia na ndi nọ na Hierapọlis.


otú a, ebe unu di ayi n'obi nke-uku, ọ diri ayi ezi nma ime ka unu keta, ọ bughi nání ozi ọma nke Chineke, kama ọ bu kwa nkpuru-obi nke aka ayi, n'ihi na emere ka unu buru ndi ayi huru n'anya.


ma achọghm ime ihe ọ bula mb͕e i kēkweyeghi; ka idi-nma-gi we ghara idi ka agāsi na ọ di n'uzọ nkpà, kama ka o we di n'uzọ ọchichọ-obi-gi.


ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Nāzùnu ìgwè aturu ntà Chineke nke di n'etiti unu, nēlekọta ha anya, ọ bughi n'ihi na nkpà nākpa unu, kama site n'ọchichọ obi, dika Chineke chọrọ; ọ bughi kwa n'ihi urù nēweta ihere, kama n'ihi na unu di ọku n'obi;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan