Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 8:1 - Bible Nso

1 Ọzọ, umu-nnam, ayi nēme ka unu mara amara Chineke nke enyeworo nime nzukọ Kraist nile nke Masedọnia;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Anyị chọrọ ime ka unu mara, ụmụnna m, ihe banyere ihe nke amara Chineke rụrụ na nzukọ niile dị na Masidonia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 8:1
15 Iomraidhean Croise  

Onye nara talent abua ahu we biakute kwa ya, si, Onye-nwe-ayi, i rara talent abua nyem n'aka: le, eritaram talent abua ọzọ n'urù.


onye, mb͕e ọ biaruru, mb͕e ọ hu-kwa-ra amara Chineke, ọ ṅuria; o we riọ ha nile, ka ha zube n'obi-ha inọgide n'ebe Onye-nwe-ayi nọ:


Ewe me ka Pọl hu ọhù n'abali: Otù nwoke, bú onye Masedọnia, nēguzo, nāriọ ya, si, Gabita na Masedọnia, yere ayi aka.


Ma mb͕e ọtutu arọ gasiri abiarurum iluru mba nkem ọlu ebere, na iche onyinye di iche iche n'iru Chineke:


N'ihi na ọ di Masedọnia na Akaia ezi nma inye ndi-ob͕eye n'etiti ndi nsọ nọ na Jerusalem ihe ufọdu ha gēnwekọ.


Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.


mb͕e m'nọ-kwa-ra n'etiti unu, nọ kwa na nkpà, abughi m onye ọ bula ibu arọ́; n'ihi na umu-nna-ayi, mb͕e ha si na Masedọnia bia, ha mezuru ihe nke fọdurum inwe; edebe-kwa-ram onwem n'uzọ nile ọ bula ka m'ghara inyib͕u unu, otú a ka m'gēdebe kwa onwem.


N'ihi na ije-ozi nke ifè-òfùfè a abughi nání ihe nēmezu ihe fọduru ndi nsọ inwe, kama o site-kwa-ra n'ọtutu ekele anēkele Chineke we babiga ókè;


n'ihi na amataram obi di ọku unu, nke m'nānyara ndi Masedọnia isi bayere unu, na Akaia akwadebewo n'arọ gara aga; inu-ọku-unu kwali-kwa-ra obi ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha.


ka ewe ghara ime ka ihere me ayi onwe-ayi n'uzọ ọ bula (ka ayi ghara isi, unu onwe-unu) n'ihe a nke ayi dabere, ma asi na ndi Masedọnia gēsom bia, we hu na unu akākwadebeghi.


Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n'etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya;


anamadọb͕u kwa onwem n'ọlu ime ihe a, nāb͕asi nb͕a ike dika i1usi-ọ1u-ike nke Ya si di, nke nālusi ike nimem n'ike.


n'ihi na unu nēme ya n'ezie n'ebe umu-nna-ayi nile ndi bi na Masedọnia dum nọ. Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan