Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 7:9 - Bible Nso

9 Ub͕u a anamaṅuri ọṅu, ọ bughi na emere ka ihe wuta unu, kama na emere ka o wuta unu rue nchèghari: n'ihi na emere ka o wuta unu dika Chineke chọrọ, ka unu we ghara isite n'ayi yi iyì n'ihe ọ bula.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ma ugbu a ana m aṅụrị ọṅụ na m dere akwụkwọ ahụ. Ọ bụghị nʼihi na ọgụgụ ya wetaara unu obi ọjọọ, kama ọ bụ nʼihi na mwute o wutere unu emeela ka unu chegharịa. Ụdị mwute unu nwere bụ ụdị mwute Chineke chọrọ ka ndị nke ya nwee. Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị unu nʼihi akwụkwọ anyị deere unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 7:9
18 Iomraidhean Croise  

N'ihi na m'gēgosi ajọ omumem; M'gēcheb͕u onwem bayere nmehiem.


Iru-újú di nma kari ichì-ọchì: n'ihi na esitere n'ijọ-njọ nke iru me ka obi di nma.


M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.


Ya mere, mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu;


Asim unu, na otù a ọṅù di n'iru ndi-mọ-ozi Chineke n'isi otù onye-nmehie nke nēchèghari.


Ma ayi aghaghi ime ka obi tọ ayi utọ na iṅuri ọṅu: n'ihi na nwa-nne-gi nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fukwara efu, ewe hu ya.


Asim unu, na otú a ọṅu gādi n'elu-igwe n'isi otù onye-nmehie nke nēchèghari, kari n'isi ọgu ndi ezi omume anọ na iri na iteghete, ndi nchèghari nādighi nkpà.


nāgwasi unu ike, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, okwu nchèghari n'ebe Chineke nọ, na okwukwe n'ebe Onye-nwe-ayi Jisus nọ.


N'ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n'idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n'amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n'amara Chineke, ka ayi biri obi n'uwa, ma ọ bu n'ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.


n'ebe ndia nọ ọ bu isìsì nke sitere n'ọnwu we dubà n'ọnwu; n'ebe ndi ahu anāzọputa nọ ọ bu isìsì nke sitere na ndu we dubà na ndu. Ma ònye ruru ime ihe ndia?


N'ihi na asi na ọ bu ezie na ejim akwukwọ-ozim me ka o wuta unu, akwaghm uta, asi na ọ bu ezie na anamakwari uta; n'ihi na anamahu na akwukwọ-ozi ahu mere ka o wuta unu, ma asi na ọ bu ezie na ọ bu nání otù oge hour ka o wutara unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan