Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 7:5 - Bible Nso

5 N'ihi na mb͕e ayi bia-kwa-ra na Masedọnia, anu-aru-ayi adighi nfé ma-ọli, kama anākpab͕u ayi n'akuku nile; ilu-ọ̀gù di n'èzí, egwu di nime.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Nʼihi na mgbe anyị batara Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nʼaka nri na aka ekpe bịakwute anyị, ọgụ nʼezi, egwu nʼime.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 7:5
23 Iomraidhean Croise  

ma nduru ahu ahughi ebe-izu-ike nye ọbu-ukwu-ya, ọ we laghachikute ya rue n'ub͕ọ, n'ihi na miri ahu di n'elu uwa nile: ọ we setipu aka-ya, were ya, me ka ọ bakute ya nime ub͕ọ.


Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu, Ha we chugharia ya n'ukwu-ya.


Ndi di iche iche gādi kwa ka lime akpọrọ ọku: dika ogwu eb͕uturu eb͕utu, nke anēsure n'ọku.


N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, ujọ dim buruburu. Gosinu, ayi gēgosi kwa ya, ka ha nāsi, bú ndi nile mu na ha di n'udo, ndi nēche nche n'akukum; eleghi anya agāràra ya, ayi ewe nwe ike imegide ya, bọ̀ọ ọ́bọ̀-ayi n'aru ya.


I siri, Biko, ahuhu nādirim! n'ihi na Jehova atukwasiwo ihe-nwuta n'elu ihe-nb͕um; adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ize-umem, ma achọtaghm izu-ike.


Apula ibà n'ọhia, eje-kwa-la ije n'uzọ; n'ihi na onye-iro nwere mma-agha, ujọ di buruburu.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na agamab͕asa irum megide unu taa! n'arum ka aru nādighi obim ike.


Ma mb͕e ùzù ahu tubìri, mb͕e Pọl kpọtasiri ndi nēso uzọ Jisus, kasi kwa ha obi, o kele ha ekele ikpe-azu we pua iga ba na Masedọnia.


N'ihi na ọ di Masedọnia na Akaia ezi nma inye ndi-ob͕eye n'etiti ndi nsọ nọ na Jerusalem ihe ufọdu ha gēnwekọ.


Ejim inya-isi ahu n'aru-unu, umu-nnam, nke m'nānya nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi, we kwusie ike na anamanwu kwa-ubọchi.


Ma m'gābiakute unu, mb͕e ọ bula m'gāgabigasi nime Masedọnia; n'ihi na agajem igabiga nime Masedọnia;


mọm adighi nfé ma-ọli, n'ihi na ahughi m Taitọs nwa-nnam: kama ekelerem ha ekele ikpe-azu, we pua je Masedọnia.


Ede-kwa-ram otù ihe nka n'akwukwọ, ka m'we ghara inwe ihe-nwuta mb͕e m'biara n'aka ndi o kwesiri ka m'ṅuria ọṅu n'aru ha; ebe m'tukwasiworo obi n'ebe unu nile nọ, na ọṅùm bu ọṅù nke unu nile.


N'ihi na ihe mere m'degara unu akwukwọ bu kwa nka, ka m'we mara nnwaputa unu, ma unu bu ndi nāṅa nti rue ihe nile.


Anamatu egwu unu, ma o nwere uzọ ọ bula m'dọb͕uworo onwem n'ọlu n'aru unu n'efu.


Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí, Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile; Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ.


N'ihi nka mu onwem kwa, mb͕e m'nāpughi idi nānagide ya ọzọ, eziterem ka m'mara okwukwe-unu, ma o nwere uzọ ọ bula onye-ọnwunwa ahu nwarari unu, ndọb͕u ayi dọb͕uru onwe-ayi n'ọlu we ghọ ihe-efu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan