Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 6:14 - Bible Nso

14 Unu na ndi nēkweghi ekwe ekekọtala onwe-unu, n'ihi na unu na ha di iche: n'ihi na òle nkekọ ezi omume na imebi-iwu nēkekọ? ma-ọbu òle nnwekọ ìhè na ọchichiri nēnwekọ?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọbụla. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na ajọ omume nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 6:14
44 Iomraidhean Croise  

m'gēme kwa gi ka i were Jehova, bú Chineke nke elu-igwe na Chineke nke uwa, ṅu iyi, na i gaghi-alutara nwam nwunye sitere n'umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n'etiti ha:


Elaija we biarue ndi Israel nile nso, si, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu ganārughari n'etiti uzọ abua ndia? ọ buru na Jehova bu Chineke, jesonu Ya: ọ buru Beal, jesonu ya. Ma ndi Israel azaghi ya okwu ọ bula.


Jihu nwa Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, we pua izute ya, ọ si eze, bú Jehoshafat, Ò kwesiri gi iyere onye nēmebi iwu aka? ọ̀ bu kwa ndi nākpọ Jehova asì ka i nāhu n'anya? ma n'ihi ihe a iwe dikwasi gi site n'iru Jehova.


Ha we nye aka-ha ime ka ndinyom-ha pua; ebe ikpe mara ha, ha we nye ebulu nke ìgwè aturu n'ihi ikpe-ọmuma-ha.


Ma ha gwakọtara onwe-ha na mba nile nke ala ahu, We muta ọlu nile ha:


Onye ekekọtaworo mu na ndi nile nātu egwu Gi n'otù ka m'bu, Onye ekekọtaworo mu na ndi nēdebe ihe-iriba-ama-Gi nile n'otù.


Asiwokwam ndi nsọ ndi nọ n'uwa, Na ndi di ebube nke ọ bu nání ihe-ha nātọm utọ:


i we lutara umu-gi ndikom ufọdu nime umu-ha ndinyom, umu-ha ndinyom we so chi-ha nākwa iko, me kwa ka umu-gi ndikom soro chi-ha nākwa iko.


Gi na onye-iwe abula eyì; I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n'ulo:


Ihe-árú n'anya ndi ezi omume ka onye ajọ omume bu: Ọzọ, ihe-árú n'anya onye nēmebi iwu ka onye ziri ezi n'uzọ-ya bu.


Unu gēdebe ukpurum nile. Emela ka anu-ulo-gi di iche iche nāb͕a onwe-ha: aghala uzọ nkpuru abua n'ubi-gi: uwe nke eji uzọ ihe abua kpakọta agaghi-abia n'aru-gi.


Juda aghọḅuwo nghọḅu, ọ bu kwa ihe-árú ka emeworo n'Israel na nime Jerusalem; n'ihi na Juda emewo ka idi-nsọ Jehova nke Ọ huworo n'anya ghara idi nsọ, ọ luwo kwa nwa-nwan yi nke chi ala ọzọ.


Ọ̀ bughi kwa nání otù ka O mere, ọ bu ezie na O nwere mọ fọduru? Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka O mere nání otù? Ọ nāchọ nkpuru nke Chineke. N'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka nwoke ghara kwa ighọḅu nwunye ọ lutara n'okorọbia.


Uwa apughi ikpọ unu asì; ma ọ nākpọ Mu onwem asì, n'ihi na Mu onwem nāb͕ara ya àmà, na ọlu-ya nile jọrọ njọ.


Ma mb͕e arapusiri ha, ha biakutere ndi nke aka ha, we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye siri ha-ri.


Unu apughi iṅu iko Onye-nwe-ayi na iko ndi-mọ ọjọ: unu apughi iketa table Onye-nwe-ayi na table ndi-mọ ọjọ.


Unu ekwela ka eduhie unu: Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma.


Edegaram unu n'akwukwọ-ozim ka unu na ndi nākwa iko ghara imekọ ihe;


kama nwa-nna nēwere nwa-nna-ya je ikpé, nka bu kwa n'iru ndi nēkweghi ekwe?


Ekewo nwunye n'aru di-ya ka oge di-ya nọ na ndu ra; ma asi na di-ya adawo n'ura ọnwu, o nwere onwe-ya ilu di ọ nāchọ; ma ọ bu nání nime Onye-nwe-ayi.


ka unu we ghọ ndi nādighi ita uta ndi nāghọghi kwa aghughọ, umu Chineke ndi anāpughi ita uta n'etiti ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke nēnwe kwa anya-uhie, ndi anāhu unu n'etiti ha dika ndi nēnye ìhè n'uwa,


Unu ndi nākwa iko, ùnu amataghi na ibu eyì nke uwa bu ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bula nke zubere ibu eyì nke uwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan