Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 6:12 - Bible Nso

12 Adighi-eme ka unu nọ n'ọnọdu di oké nkpà nime ayi, ma anēme ka unu nọ n'ọnọdu di oké nkpà n'obi nke unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Anyị ji obi anyị niile hụ unu nʼanya, ma unu mechiri obi unu nʼebe anyị nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 6:12
9 Iomraidhean Croise  

Ọbuná otú a ka Ọ ràraworo gi isi n'ọnu nkpab͕u Ba n'ebe sara mbara, nke ebe di nkpa nādighi n'okpuru ya; Ndọba ihe-oriri nke table-gi gējuputa kwa n'abuba.


Mb͕e i nēje ije, agaghi-akpagide nzọ-ukwu-gi; Ọ buru kwa na i b͕a ọsọ, i gaghi-asu ngọngọ.


Ọ di nma, bú ihe-ọhuhu nke anya abua, kari njeghari nke nkpuru-obi: nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


Gi ulo Jekob, àgāsi, Mọ nke Jehova, Ọ̀ rapuru ibu onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ? ihe ndia, hà bu omume-Ya? okwum nile, hà adighi-eme onye nējeghari n'ezi nma?


N'ihi na warara ka ọnu-uzọ ahu di, nkpagide ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà na ndu, ole-na-ole ka ha di kwa, bú ndi nāchọta ya.


anākpab͕u ayi n'akuku nile, ma adighi-akpab͕ubiga ayi ókè; ayi nwere obi abua, ma ayi adighi-enwebiga obi abua ókè;


Nyenu ayi uzọ n'obi-unu; ayi emeghi onye ọ bula ajọ omume, ayi emebighi onye ọ bula, ayi erib͕ughi onye ọ bula.


N'ihi na Chineke bu onye-àmà nkem, otú agu unu nile nāgusim ike n'obi-ebere nke Kraist Jisus.


Ma onye ọ bula nke nwere ihe uwa nka o ji biri, nke hu-kwa-ra nwa-nna-ya ka ọ nọ na nkpà, o we mechigide ya obi ebere ya, ìhunanya Chineke si aǹa digide nime ya?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan