Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 6:11 - Bible Nso

11 Ndi Kọrint, ọnu-ayi ghere oghe igwawa unu okwu, emewo ka obi-ayi di obodobo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ndị enyi anyị nọ na Kọrint, anyị agwala unu ihe niile dị anyị nʼobi, anyị emeghepụla obi anyị nye unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 6:11
20 Iomraidhean Croise  

Ka m'kwue, ka aru we dajuam; M'gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum, za.


N'uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu ka m'gāb͕a ọsọ, N'ihi na I gēme ka obim sa mbara.


Onye-nwe-ayi, I gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum abua; Ọnum gēgosi kwa otuto-Gi.


Mb͕e ahu i gāhu we nwue enwu, obi-gi gātu kwa oké egwu, sa mbara; n'ihi na agēchigharikute gi ihe bara uba nke oké osimiri, àkù nke mba di iche iche gābiakute gi.


Ma aka Jehova rurumri aru n'anyasi, tutu onye b͕apuru ab͕apu abia; O we saghe ọnum, rue mb͕e ọ biakuterem n'ututu; ewe saghe ọnum, m'we ghara ida kwa ob͕i ọzọ.


E, ọzọ kwa, n'ihi na manya-vine-ya bu ihe-nghọb͕u, nwoke di nganga ka ọ bu nke nādighi-anọ kwa n'ulo; onye meworo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara dika ala-mọ, ya onwe-ya di kwa ka ọnwu, afọ adighi-eju kwa ya, o we me ka mba nile zukọta n'ebe ọ nọ, ọ nāchikọta kwa ndi nile di iche iche n'ebe ọ nọ.


Mb͕e ihe ndia gasiri o si n'Atens pua, bia rue Kọrint.


Krispọs, onye-isi ulo-nzukọ, we kwere n'Onye-nwe-ayi, ya na èzí-na-ulo-ya dum; ọtutu madu n'etiti ndi Kọrint we kwere mb͕e ha nuru, ewe me ha baptism.


Ma mu onwem gēwere obi-utọ nile mefu ihe m'nwere kwe kwa ka emefusia mu onwem n'ihi nkpuru-obi-unu. Ọ buru na anamahubiga unu n'anya ókè kari, ànāhum n'anya nke-ntà kari?


N'ihi na m'sitere na nkpab͕u na ihe-nb͕u nke obi riri nne were ọtutu anya-miri degara unu akwukwọ; ọ bughi ka eme ka o wuta unu, kama ka unu we mara ihu-n'anya nke m'hubigara unu ókè kari.


Ma ndi Galetia nēnweghi uche, ònye riri obi-unu, ndi ewere Jisus Kraist gosi ọra madu n'anya-unu, dika Onye akpọgidereri n'obe?


Umu-nnam, ariọm unu, menu onwe-unu ka unu di ka mu onwem, n'ihi na mu onwem me-kwa-ra onwem ka m'di ka unu onwe-unu. Unu emeghm ajọ omume ọ bula:


nēkpe kwa ekpere n'ihim, ka ewe nyem okwu n'isaghe ọnum, iwere nkwuwa-okwu me ka madu mara ihe-omimi nke ozi ọma,


ebe unu matara na ezi ihe ọ bula onye ọ bula nēme, nka ka ọ gānaghachi n'aka Onye-nwe-ayi, ma ọ bu orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya.


N'ihi na Chineke bu onye-àmà nkem, otú agu unu nile nāgusim ike n'obi-ebere nke Kraist Jisus.


Ma unu onwe-unu makwara, ndi Filipai, na nime nmalite nke ozi ọma, mb͕e m'siri na Masedọnia puta, ọ dighi nzukọ Kraist ọ bula nke mu na ya nwekọrọ ihe n'okwu bayere onyinye na ọnina, ma-ọbughi nání unu onwe-unu;


Le, anamabia ọsọsọ; ugwọ-ọlum di kwa n'akam, inyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya si di.


Hana we kpe ekpere, si: Ọ nātọ obi m utọ n'ime Jehova, Mpim adiwo elu n'ime Jehova: Ọnum asawo mbara n'elu ndi-irom, N'ihi na aṅuriwom ọṅu na nzọputa-Gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan