Akpọgidekọwo mu na Kraist n'obe; ọ bughi kwa mu onwem nādi ndu ọzọ, kama ọ bu Kraist nādi ndu nimem ma ndu ahu m'nādi n'anu-aru ub͕u a, anamadi ya n'okwukwe, bú nke m'kwere n'Ọkpara Chineke, Onye hurum n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihim.
Onye unu huru n'anya, ọ bu ezie na unu ahughi Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bu ezie na unu adighi-ahu Ya anya ub͕u a, obi we nātọ unu utọ nke-uku n'ọṅù nke anāpughi ikwu okwu nke enyewo-kwa-ra ya otuto: