Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 5:1 - Bible Nso

1 N'ihi na ayi matara na asi na akwaturu ulo nke uwa, bú ulo-ikwū-ayi, ayi nwere ulo ewuru nke sitere na Chineke, ulo anējighi aka wu, di ebighi-ebi, n'elu-igwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Nʼihi na anyị ma nke ọma na mgbe e mebiri ụlọ ikwu nke anyị bi nʼime ya, bụ ụlọ nke ụwa a, anyị nwere ụlọ nke sitere na Chineke, ụlọ nke ejighị aka wuo, ga-adị ebighị ebi nʼeluigwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 5:1
25 Iomraidhean Croise  

n'ọsusọ iru-gi ka i gēri nri, rue mb͕e i gālata n'ala; n'ihi na esiri na ya weputa gi; n'ihi na ájá ka i bu, ọ bu kwa ájá ka i gālata.


I nēbulim nye ifufe, I nēme ka o burum dika inyinya, I ne-atugharim n'elu ebili nmirì.


Ò gesi kwa aṅa ghara ibo kari ndi bi n'ulo urọ? Nke ntọ-ala-ha di n'ájá, Ndi anāzọpia azọpia dika nla.


Mb͕e ahu ndi-irom gālaghachi azu n'ubọchi m'gākpọku Gi: Nka ka m'mara, na Chineke dirim.


Emewo ka ebe-obibim bulie ije, esiwo kwa n'ebe m'nọ bulaga ya dika ulo-ikwū onye-ọzùzù-aturu: Apiakọtawom ndum dika ọkpa-ákwà si apiakọta ákwà; na ǹkwé-ákwà ka Ọ gēbipum: Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia.


Ayi onwe-ayi nuru ka Ọ nāsi, Mu onwem gākwatu ulo nsọ a nke ejiri aka me, n'ubọchi atọ M'gēwu kwa ulo ọzọ nke anējighi aka me.


Otú ọ di, Onye kachasi ihe nile elu adighi-ebi n'ulo eji aka wu; dika onye-amuma siri,


N'ihi na ayi bu ndi ha na Chineke nālukọ ọlu: unu bu ubi Chineke, buru kwa ulo Chineke nēwu.


Ma ayi nwere àkù a n'ite ájá, ka ọkika nke ike ahu we buru nke Chineke, ghara kwa isite n'ayi onwe-ayi;


N'ihi na ayi, bú ndi nọ n'ulo-ikwū a, ayi nāsu udè ezie, ebe ọ nānyib͕u ayi; n'ihi na ayi achọghi ka eyipu ayi ya, kama ka eyikwasi ayi ihe n'elu ya, ka ndu we loda ihe puru inwu anwu.


ọ bu kwa nime Ya ka ejiri obibì-úgwù anējighi aka me bì unu úgwù, n'iyipuchasi aru nile nke bu anu-aru, n'obibì-úgwù nke Kraist;


Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nāhu kwa ahuhu ndia: ma ihere adighi-emem; n'ihi na amataram Onye m'kweworo okwu-Ya, eme-kwa-ra ka m'kweye na Ọ puru iche ihe m'nyere n'aka-Ya idebe nche rue ubọchi ahu.


n'ihi na ọ nēle anya obodo ahu nke nwere ntọ-ala ahu, nke Chineke bu onye-ọ̀kà-ya na onye luru ya.


Ma Kraist, ebe Ọ biara ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà nke ezi ihe nile gaje ibia, O sitere n'ulo-ikwū ahu nke ka uku na nke zuru okè kari, ọ bughi nke eji aka me, nke isi-ya bu, ọ bughi nke òkìkè a,


N'ihi na Kraist abàghi n'ebe nsọ eji aka me, bú ihe-atù yiri ebe nke bu ebe nsọ n'ezie; kama Ọ bàra n'elu-igwe onwe-ya, igosi Onwe-ya n'iru Chineke n'ihi ayi ub͕u a:


ka ayi we keta nketa nke anāpughi imebi, nke anādighi-emeru kwa emeru, nke nādighi-atalata kwa, nke edebeworo n'elu-igwe nye unu,


Ebe anēme ka ihe ndia nile la n'iyì otú a, ọ̀ bu aha madu gini ka unu nāghaghi ibu n'ibi-obi nsọ nile na nsọpuru-Chineke nile,


Ayi onwe-ayi matara na ayi esitewo n'ọnwu ba na ndu, n'ihi na ayi nāhu umu-nna-ayi n'anya. Onye nādighi-ahu n'anya nānọgide n'ọnwu.


Nime nka ka ayi gāmara na ayi bu ndi nke ezi-okwu ahu, me kwa ka obi-ayi kwenye ekwenye n'iru Ya,


Ndi m'huru n'anya, ub͕u a ka ayi bu umu Chineke, akēmeghi kwa ka ọ puta ìhè ihe ayi gābu. Ayi matara na, ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ayi gābu ndi yiri Ya; n'ihi na ayi gāhu Ya otú Ọ di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan