Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 4:2 - Bible Nso

2 kama ayi juru ihe-nzuzo nile nke nēweta ihere, ayi adighi-ejeghari n'aghughọ, ayi adighi-emeso kwa okwu Chineke n'uzọ itu-ntu; kama ayi ji ngosi nke ezi-okwu nēme ka akọ-na-uche nke madu nile n'otù n'otù mara ayi n'iru Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Anyị ahapụla omume nzuzo niile na-eweta ihere. Anyị ahapụla ụzọ aghụghọ niile, maọbụ iji okwu Chineke na-atụ asị. Kama site nʼikwupụta eziokwu ahụ ka ndị mmadụ were ezi akọnuche ha mata ụdị mmadụ anyị bụ nʼihu Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 4:2
16 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Menu ya nke ub͕ò abua; ha we me ya nke ub͕ò abua. Ọ si, Menu ya nke ub͕ò atọ; ha we me ya nke ub͕ò atọ.


N'ihi na ihere ozi ọma ahu adighi-emem: n'ihi na ọ bu ike nke Chineke rue nzọputa nye onye ọ bula nke kwere; onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa.


Ọ̀ bu nkpuru gini kwa ka unu nwere n'oge ahu n'ihe nile ahu nke ihere ha nēme unu ub͕u a? n'ihi na ọgwugwu ihe nile ahu bu ọnwu.


Ya mere, unu ekpela ihe ọ bula ikpé mb͕e oge ahu akērughi, rue mb͕e ọ bula Onye-nwe-ayi gābia, Onye gēweputa kwa ihe nile ezoro ezo nke ọchichiri n'ìhè, me kwa ka ìzù nile nke obi nile puta ìhè; mb͕e ahu ka madu nile n'otù n'otù gēnwe kwa otuto-ha site n'aka Chineke.


N'ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n'idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n'amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n'amara Chineke, ka ayi biri obi n'uwa, ma ọ bu n'ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.


Ma anamatu egwu, ma ọ nwere uzọ ọ bula agēmebi uche-unu ka unu pua n'afọ-ofufo na idi-ọcha nke di n'ebe Kraist nọ, dika agwọ ahu were aghughọ-ya ghọb͕ue Iv.


Ma asi na ọ bu ezie na abum onye nāmutaghi akwukwọ n'uzọ ikwu okwu, ma abughi m otú a n'uzọ ihe-ọmuma; kama ayi mere ka ọ puta ìhè nye unu n'ihe nile ọ bula n'etiti madu nile.


N'ihi na ayi adighi ka ọra madu, ndi were ihe nādighi nma nētigwa n'okwu Chineke: kama dika ndi sitere n'idi-ọcha, kama dika ndi sitere na Chineke, ọ bu n'iru Chineke, nime Kraist ka ayi nēkwu.


Ya mere ebe ayi matara egwu Onye-nwe-ayi, ayi nēme ka madu kweye, ma emewo ka ayi puta ìhè nye Chineke; anamatukwasi kwa obi na emewo ka ayi puta kwa ìhè nime akọ-na-uche-unu.


site n'otuto na ihe-ihere, site na nhota ọjọ na nhota ọma; dika ndi-nduhie, ma ayi bu ndi ezi-okwu;


N'ihi na asi na ọ di ihe m'nyaworo ya isi bayere unu, emeghi ka ihere mem; kama dika ayi gwara unu ihe nile n'ezi-okwu, otú a ka esi hu kwa na inya-isi-ayi, nke m'nyara n'iru Taitọs, bu ezi-okwu.


ka ayi we ghara ibu umu ọhu ọzọ, ndi ifufe nile ọ bula nke ozizí nēfeghari nēbughari kwa, nime itu-ntu nke madu, nime aghughọ, nke ha ji ezuputa nduhie;


n'ihi na ọ bu ihe-ihere ọbuná ikwu okwu bayere ihe nile ha nēme na nzuzo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan