Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 4:15 - Bible Nso

15 N'ihi na ihe nile di n'ihi unu, ka amara, ebe o riri nne site n'aka ndi ka n'ọnu-ọgugu, ka o we me ka ikele-ekele babiga ókè rue ebube nke Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 4:15
21 Iomraidhean Croise  

Chuara Chineke ekele dika àjà; Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere:


Onye nāchu ekele dika àjà nāsọpurum; Ọ bu kwa onye nēdozi uzọ-ya Ka m'gēme ka ọ hu nzọputa Chineke.


Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di.


N'ihi na ọ bu ezie na enwerem onwem n'ebe madu nile nọ, ma emerem onwem ka m'buru orù madu nile, ka m'we rita ọtutu madu n'urù kari.


ebe unu nēyekọ kwa aka n'ihi ayi n'aririọ-unu; ka ọtutu madu we kele ekele n'ihi ayi bayere onyinye-amara enyeworo ayi site n'aka ọtutu madu.


ma ọ bughi nání otú a, kama nzukọ Kraist nile rọputa-kwa-ra ya ka ọ nēso ayi n'ije ije n'amara nka, nke ayi nēje ozi ya inye Onye-nwe-ayi otuto, na igosi obi di ọku nke ayi:


ha we nēnye Chineke otuto n'ihe ha huru n'arum.


Ub͕u a anamaṅuri ọṅu n'ahuhu m'nāhu n'ihi unu, anamemezu kwa n'akuku nkem ihe fọduru na nkpab͕u nile nke Kraist-ayi n'anu-arum n'ihi aru-Ya, nke bu nzukọ-Ya;


ma amara nke Onye-nwe-ayi, ya na okwukwe na ihu-n'anya nke di nime Kraist Jisus, riri nne nke-uku.


N'ihi nka ka m'nwere ntachi-obi n'ihe nile n'ihi ndi arọputara, ka ha onwe-ha we ru kwa nzọputa nke di nime Kraist Jisus, ya na ebube ebighi-ebi.


Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube:


ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan