Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 4:10 - Bible Nso

10 ayi nēbughari n'aru-ayi mb͕e nile ob͕ub͕u nke Jisus, ka ewe me kwa ka ndu nke Jisus puta ìhè n'aru-ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ọtụtụ mgbe, anyị na-ebugharị nʼahụ anyị ọnwụ Jisọs, ka ndụ nke Jisọs nwekwa ike pụta ìhè nʼahụ anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 4:10
17 Iomraidhean Croise  

Ọ fọduru nwa oge, uwa ahukwaghm ọzọ; ma unu onwe-unu nāhum: unu onwe-unu gādi kwa ndu, n'ihi na Mu onwem nādi ndu.


N'ihi na asi na ejiri oyiyi ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe, agēji kwa oyiyi nke nbilite-n'ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe;


Ma ọ buru na ayi na Kraist nwukọrọ, ayi kwere na ayi na Ya gādikọ kwa ndu ọzọ;


Dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, N'ihi Gi ka anēme ka ayi nwua ogologo ubọchi dum; Aguru ayi dika aturu ob͕ub͕u.


N'ihi na dika ahuhu nile Kraist huru nābabiga ókè n'ebe ayi nọ, otú a ka nkasi-obi-ayi nābabiga kwa ókè site n'aka Kraist.


e, ayi onwe-ayi enwewo ọziza azara nime onwe-ayi na ọ bu ọnwu, ka ayi we ghara itukwasi obi n'onwe-ayi, kama ọ bu na Chineke Onye nēme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie:


n'ihi na esitere n'adighi-ike kpọgide Ya n'obe, ma O sitere n'ike Chineke nādi ndu. N'ihi na ayi onwe-ayi bu kwa ndi nādighi ike nime Ya, ma ayi gēsite n'ike Chineke n'ebe unu nọ so Ya di ndu.


N'ihi na arara ayi onwe-ayi, bú ndi di ndu, nye n'aka ọnwu mb͕e nile n'ihi Jisus, ka ewe me kwa ka ndu nke Jisus puta ìhè n'anu-aru-ayi nke puru inwu anwu.


Site n'ub͕u a ka onye ọ bula ghara isob͕um: n'ihi na mu onwem nēbu n'arum apa di iche iche nēgosi na abum onye Jisus.


Ub͕u a anamaṅuri ọṅu n'ahuhu m'nāhu n'ihi unu, anamemezu kwa n'akuku nkem ihe fọduru na nkpab͕u nile nke Kraist-ayi n'anu-arum n'ihi aru-Ya, nke bu nzukọ-Ya;


Okwu a kwesiri ntukwasi-obi: N'ihi na asi na ayi soro Ya nwukọ ọnwu, ayi gēso kwa Ya dikọ ndu:


kama ebe unu nwekọrọ ahuhu nke Kraist, nāṅurinu ọṅu; ka unu we were kwa obi nātọ utọ nke-uku ṅuria nime nkpughe nke ebube-Ya.


Ọ buru na anāta unu uta n'aha Kraist, ngọzi nādiri unu; n'ihi na Mọ nke ebube na Mọ nke Chineke nānọgide n'aru unu.


Mb͕e m'huru Ya, m'we da n'ala n'ukwu-Ya dika onye nwuru anwu. O we bikwasim aka-nri-Ya, si, Atula egwu; Mu onwem bu onye mbu na onye ikpe-azu,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan