Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 3:5 - Bible Nso

5 ọ bughi na ayi ruru n'onwe-ayi, igu ihe ọ bula dika o sitere n'onwe-ayi; kama iru-eru-ayi sitere na Chineke;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ọ dịkwaghị mgbe anyị ji chee nʼime onwe anyị, na anyị nwere ike ime ihe ọbụla bara uru site nʼike aka anyị, kama ihe ọbụla anyị nwere, ihe ọbụla anyị rụpụtara, sitere nʼaka Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 3:5
19 Iomraidhean Croise  

Josef we za Fero, si, Ọ dighm n'aka: Chineke gāza aziza udo nye Fero.


Aka Chineke di kwa na Juda inye ha otù obi, ime ihe eze na ndi-isi nyere n'iwu site n'okwu Jehova.


n'ihi na Mu onwem gēnye unu ọnu na amam-ihe, nke ndi nile nēmegide unu nāgaghi-apu iguzogide ma-ọbu ikwugide okwu.


Le kwa, Mu onwem nēziputa nkwà nke Nnam n'isi-unu: ma nọdunu n'obodo a, rue mb͕e agēwere ike nke si n'elu yikwasi unu.


Mu onwem bu osisi vine ahu, unu onwe-unu bu alaka nkem: Onye nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya, onye ahu nāmi nkpuru ri nne: n'ihi na unu apughi ime ihe ọ bula ma Mu anọghi ya.


N'ihi na m'gaghi-enwe anya-ike ikwu ihe o bula ma-ọbughi n'ihe nile Kraist lutara site n'akam, ime ka ndi mba ọzọ ṅa nti, n'okwu na ọlu,


Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.


Dika amara Chineke nke enyerem si di, dika onye-isi-ọ̀kà nke mara ihe, atọrọm ntọ-ala; onye ọzọ nēwu kwa ulo n'elu ya. Ma ka onye ọ bula lezi anya otú ọ nēwu ulo n'elu ya.


Mu onwem kuru osisi, Apọlos kwọsara ya miri; ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba.


Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem.


n'ebe ndia nọ ọ bu isìsì nke sitere n'ọnwu we dubà n'ọnwu; n'ebe ndi ahu anāzọputa nọ ọ bu isìsì nke sitere na ndu we dubà na ndu. Ma ònye ruru ime ihe ndia?


Ma ayi nwere àkù a n'ite ájá, ka ọkika nke ike ahu we buru nke Chineke, ghara kwa isite n'ayi onwe-ayi;


n'ihi na ọ bu Chineke Onye nālusi ọlu ike nime unu ichọ-achọ-unu na ilusi-ọlu-ike-unu, n'ihi na ọ di Ya ezi nma.


Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.


Ihe nile i nukwara n'ọnum site n'etiti ọtutu ndi-àmà, nye ihe ndia n'aka madu ndi kwesiri ntukwasi-obi idebe, bú madu ndi ọ gēkwe kwa izí madu-ibe-ha ihe ndia.


Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n'elu bia, ebe o si n'aka Nna nke ìhè ridata, Onye ọghugha ọ bula nāpughi idi n'ebe Ọ nọ, ma-ọbu onyinyo nke nchighari nēweta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan