Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 2:12 - Bible Nso

12 Ma mb͕e m'biaruru Troas izisa ozi ọma Kraist, mb͕e emeghereri kwa ọnu-uzọ nime Onye-nwe-ayi nyem,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Mgbe m bịarutere Troas ikwusa oziọma Kraịst, e megheere m ụzọ nʼime Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 2:12
20 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ha ruru, me kwa ka nzukọ Kraist zukọta, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me, kọ-kwa-ra ha na O meghereri ọnu-uzọ okwukwe nye ndi mba ọzọ.


Ya mere ayi siri na Troas nupu ub͕ọ, we ga otù iru rue Samọtresi, n'echi-ya ayi we rue Neapọlis;


ha we gabiga akuku Misia, we ridata na Troas.


Ọtutu ọku-ọwa di kwa n'ime-ulo nke di n'elu ulo, ebe ayi zukọrọ.


Pọl, orù nke Jisus Kraist, onye akpọrọ ibu onye-ozi, onye ekewapuru nye ozi ọma Chineke,


n'ihi na emegheworom ọnu-uzọ di uku nke agēji kwa lusi ọlu ike, ọzọ, ọtutu ndi nēmegidem.


Ọ buru na ndi ọzọ eketa ike a n'ebe unu nọ, àyi onwe-ayi adighi-eketa kari? Otú ọ di, ayi ejighi ike a nara ihe; kama ayi nānagide ihe nile, ka ayi we ghara ib͕ochi ozi ọma Kraist n'uzọ ọ bula.


Ọbuná otú a ka Onye-nwe-ayi kara àkà ka ndi nēkwusa ozi ọma Ya si n'ozi ọma ahu di ndu.


N'ihi na asi na anam-ezisa ozi ọma, enweghi m ihe inya isi; n'ihi na nkpà nākpam; n'ihi na ahuhu dirim, asi na ezisaghi m ozi ọma.


N'ihi na ayi esetibigaghi onwe-ayi ókè, dika agāsi na ayi adighi-eru unu: n'ihi na ayi bu ndi buru uzọ biakute unu nime ozi ọma Kraist:


N'ihi na asi na onye ahu nke nābia nēkwusa Jisus ọzọ, onye ayi nēkwusaghi, ma-ọbu asi na unu nānara mọ di iche, nke unu nānaraghi, ma-ọbu ozi ọma di iche, nke unu nānaraghi nke-ọma, unu nānagide ya nke-ọma.


Ma-ọbu ọ̀ bu nmehie ka m'mehiere, mb͕e m'wedara onwem n'ala ka ewe welie unu onwe-unu elu, n'ihi na ezirim unu ozi ọma nke Chineke n'onyinye-efu?


Ma asi kwa na ekpudoworo ozi ọma ayi ihe, ọ bu n'etiti ndi nāla n'iyì ka ekpudoworo ya:


ndi chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndi nēkweghi ekwe kpu ìsì n'etiti ha, ka inye-ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraist, Onye bu onyinyo Chineke, we ghara iwakwasi ha.


Ayi ezìkọwo kwa ya na nwa-nna-ayi ahu onye otuto-ya n'ozi ọma ayi ruzuru nzukọ Kraist nile;


ebe ha ji nnwaputa nke ije-ozi a nēnye Chineke otuto n'ihi na edoro nkwuputa-unu n'okpuru ozi ọma Kraist, ya na n'ihi afọ-ofufo nke nnwekọ unu nēme ka ha na madu nile so unu nēnwekọ;


nēkpe-kwa-nu ekpere n'ihi ayi n'otù oge ahu, ka Chineke we meghere ayi ọnu-uzọ ikwusa okwu-Ya, ka ayi kwue ihe-omimi nke Kraist, nke m'nọ kwa n'ab͕u n'ihi ya;


ayi we ziga Timọti, nwa-nna-ayi na onye nējere Chineke ozi n'ozi ọma nke Kraist, ka o we me ka unu guzosie ike, ka o we kasi kwa unu obi n'ihi okwukwe-unu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan