Ma mb͕e nkewa na ajuju nādighi ntà diri Pọl na Banabas imegide ha, ndi Kraist we dozie ka Pọl na Banabas, na ufọdu ndi ọzọ n'etiti ha, rigoro Jerusalem jekuru ndi-ozi na ndi-okenye bayere ajuju a.
N'ihi na mu onwem n'ezie, ebe m'nānọghi n'etiti unu n'arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, ekpewom onye ahu nke lutara nka otú a ikpé ọbuná ub͕u a, dika agāsi na anọm,
N'ihi nka ka m'nēde ihe ndia n'akwukwọ mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, ka m'we ghara iwere ihe-ike meso unu mb͕e m'nọ n'etiti unu, dika ike nke Onye-nwe-ayi nyerem si di, iwuli elu dika ulo, ọ bughi kwa ikwada akwada.
N'ihi na m'sitere na nkpab͕u na ihe-nb͕u nke obi riri nne were ọtutu anya-miri degara unu akwukwọ; ọ bughi ka eme ka o wuta unu, kama ka unu we mara ihu-n'anya nke m'hubigara unu ókè kari.