Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 2:1 - Bible Nso

1 Ma ezuputaram onwem nka, na m'gaghi-abiakute unu ọzọ n'ihe-nwuta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ekpebiri m nʼime obi m na-agaghị m abịakwute unu ọzọ, iwetara unu ihe mwute.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 2:1
13 Iomraidhean Croise  

Ndi nēso uzọ Jisus, onye ọ bula ka ihe o nwere ra, we zube izigara umu-nna nime Kraist ndi bi na Judia ihe iyere ha aka:


Ma mb͕e nkewa na ajuju nādighi ntà diri Pọl na Banabas imegide ha, ndi Kraist we dozie ka Pọl na Banabas, na ufọdu ndi ọzọ n'etiti ha, rigoro Jerusalem jekuru ndi-ozi na ndi-okenye bayere ajuju a.


Banabas we zube ikuru kwa Jọn, onye anākpọ Mark, ka ya na ha yikọ je.


N'ihi na ezuberem ka m'ghara imata ihe ọ bula n'etiti unu, ma-ọbughi Jisus Kraist, ka m'mata kwa Onye ahu ka onye akpọgideworo n'obe.


Gini ka unu nāchọ? ọ̀ bu utari ka m'gēwere biakute unu, ma-ọbu ihu-n'anya na mọ nke idi-nwayọ?


N'ihi na mu onwem n'ezie, ebe m'nānọghi n'etiti unu n'arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, ekpewom onye ahu nke lutara nka otú a ikpé ọbuná ub͕u a, dika agāsi na anọm,


Ma mu onwem nākpọku Chineke ka Ọ buru onye-àmà megide nkpuru-obim, na ọ bu n'imere unu ebere ka m'nējighi bia Kọrint rue ub͕u a.


N'ihi nka ka m'nēde ihe ndia n'akwukwọ mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, ka m'we ghara iwere ihe-ike meso unu mb͕e m'nọ n'etiti unu, dika ike nke Onye-nwe-ayi nyerem si di, iwuli elu dika ulo, ọ bughi kwa ikwada akwada.


N'ihi na m'sitere na nkpab͕u na ihe-nb͕u nke obi riri nne were ọtutu anya-miri degara unu akwukwọ; ọ bughi ka eme ka o wuta unu, kama ka unu we mara ihu-n'anya nke m'hubigara unu ókè kari.


Mb͕e ọ bula m'gēzitere gi Atemas, ma-ọbu Tikikọs, were inu-ọku-n'obi biakutem rue Naikọpọlis: n'ihi na n'ebe ahu ka m'zubeworo inọgide na mb͕e oyi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan