Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 13:11 - Bible Nso

11 Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu. Ka anēme unu ka unu zu okè; ka anākasi unu obi; nātukwasinu uche-unu nile n'otù ihe; nādinu n'udo: Chineke nke ihu-n'anya na udo gānọye-kwa-ra unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 13:11
51 Iomraidhean Croise  

Umu-nne-ya we hu na ọ bu ya onwe-ya ka nna-ha huru n'anya kari umu-nne-ya nile; ha we kpọ ya asì, ha apughi kwa igwa ya okwu n'udo.


Ọ we zilaga umu-nne-ya, ha la: ọ si ha, Unu esela okwu n'uzọ.


Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.


Ya mere unu onwe-unu gēzu okè, dika Nna-unu nke elu-igwe zuru okè.


Jisus we guzo, si, Kpọnu ya. Ha we kpọ onye-ìsì ahu, si ya, Nwe obi ike: bilie, Ọ nākpọ gi.


Nnú di nma: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, gini ka unu gēji me ya ka ọ di utọ? Nwenu nnú nime unu, unu na ibe-unu di kwa n'udo.


Onye ọzọ we si kwa, M'gēso Gi, Onye-nwe-ayi; ma kwe ka m'buru uzọ kele ndi nọ n'ulom ekele ikpe-azu.


Mu onwem nime ha, Gi onwe-gi kwa nimem, ka ewe me ka ha buru ndi zuworo okè ibu otù; ka uwa we mara na Gi onwe-gi ziterem, na I hu-kwa-ra ha n'anya, dika I hurum n'anya.


ka unu rapu ihe nile achuru n'aja nye arusi, na ọbara, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ikwa-iko; ọ buru na unu edebe onwe-unu ghara imetu ihe ndia aka, ọ gādiri unu nma. Jisienu ike.


ma mb͕e o kelesiri ha ekele ikpe-azu, si kwa, M'gālaghachikute unu ọzọ, ma Chineke kwe, o si n'Efesọs nupu ub͕ọ.


Ma mb͕e egosirim na agāb͕a ajọ ìzù megide nwoke a, ngwa ngwa m'we zitere gi ya, nye kwa ndi nēbo ya iwu ka ha kwugide ya okwu n'iru gi.


Nātukwasinu uche n'otù ihe ahu n'ebe ibe-unu nọ. Unu atukwasila uche n'ihe di elu, kama ka ndi ọnọdu-ha di ala nādọrọ unu iso ha. Unu enwela uche n'anya onwe-unu.


Asi na ọ bu ihe gēkwe unu, ka ihe nke diri unu onwe-unu ra, unu na madu nile nādi n'udo.


Ya mere otú a, ka ayi nāb͕aso ihe nile diri udo, na ihe nile diri iwulirita onwe-ayi elu dika ulo.


Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n'ọṅù nile na udo nile n'ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n'ike Mọ Nsọ.


Ma ka Chineke nke udo nọyere unu nile. Amen.


Ma Chineke nke udo gāzọpia Setan n'okpuru ukwu-unu ọsọsọ. Amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.


Ma, umu-nnam, esiterem n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist riọ unu, ka unu nile nēkwu otù ihe, ka nkewa ghara kwa idi n'etiti unu; kama ka eme unu ka unu zue okè n'otù uche ahu na n'otù ìzù ahu.


Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula.


Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n'anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere unu nile.


N'ihi na ayi nāṅuri ọṅu, mb͕e ọ bula ayi onwe-ayi nādighi ike, ma unu onwe-unu di ike: nka ka ayi nēkpe-kwa-ra Chineke, bú ka eme ka unu zu okè.


ime ka ndi nsọ zu okè ilu ọlu nke ije-ozi, iwuli aru nke Kraist elu dika ulo:


nānu ọku n'obi idebe idi-n'otù nke Mọ Nsọ nime ihe-ọkiké nke bu udo.


Udo diri umu-nna-ayi, ya na ihu-n'anya nke ya na okwukwe yikọ, site na Chineke, bú Nna, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.


Nání nēbinu obi dika ndi ala elu-igwe n'uzọ kwesiri ozi ọma nke Kraist: ka ọ gābu, ma m'bia hu unu ma-ọbu na anọghm, ka m'we nu ihe bayere ọnọdu-unu, na unu nēguzosi ike n'otù Mọ Nsọ, nēwere kwa otù nkpuru-obi lukọrọ okwukwe nke ozi ọma ahu ọ̀gù si-ike;


náni nka, n'ihe ahu ayi b͕aruru, ka ayi nāgazi dika ihe ahu si di.


Ariọm Yuodia, ariọkwam Sintiki, ka ha tukwasi uche n'otù ihe ahu nime Onye-nwe-ayi.


Nāṅurinu ọṅu n'Onye-nwe-ayi mb͕e nile: m'gāsi ọzọ, Nāṅurinu ọṅu.


Ihe unu matara, nke unu nata-kwara, nke unu nu-kwa-ra, nke unu hu-kwa-ra n'arum, nēmenu ihe ndia: Chineke nke udo gānọyere kwa unu.


abali na ehihie nāriọbiga aririọ ókè nke-uku ri nne ka ayi we hu iru-unu, dochi kwa ihe fọduru n'okwukwe-unu?


Ya mere nke fọduru, umu-nna-ayi, ayi nēkpere unu, nāriọ kwa unu nime Onye-nwe-ayi Jisus, ka, dika unu natara n'aka-ayi otú unu nāghaghi ijeghari na ime ihe gātọ Chineke utọ, ọbuná dika unu nējeghari, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari.


Ya mere werenu okwu ndia nākasirita ibe-unu obi.


ka unu were kwa ihunanya sọpuru ha gabiga ókè nke-uku ri nne n'ihi ọlu-ha. Birinu n'udo n'etiti onwe-unu.


Nāṅurinu ọṅu mb͕e nile;


Chineke nke udo, Ya Onwe-ya dozu kwa unu nsọ n'uzọ dum; ka edebezu kwa mọ-unu na nkpuru-obi-unu na aru-unu dum, nādighi ita uta n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.


Ma ka Ya onwe-ya, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na Chineke, bú Nna-ayi, Onye huru ayi n'anya nye kwa ayi nkasi-obi ebighi-ebi na ezi olile-anya nime amara,


Nke fọduru, umu-nna-ayi, nēkpenu ekpere bayere ayi, ka okwu Onye-nwe-ayi we b͕a ọsọ, ka ewe nye kwa ya otuto, otú ọ di kwa n'etiti unu;


Ma Ya onwe-ya, bú Onye-nwe udo, Ya nye unu udo mb͕e nile n'uzọ nile. Ka Onye-nwe-ayi nọyere unu.


Ma nāb͕anari agu ihe ọjọ nāgu nwa-okorọbia, nāb͕aso kwa ezi omume, okwukwe, ihu-n'anya, udo, gi na ndi nākpọku Onye-nwe-ayi site n'obi di ọcha.


Nāb͕asonu udo n'ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agaghi-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nweghi ya:


Ma Chineke nke udo, Onye were ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ahu si na ndi nwuru anwu kughachi oké Onye-ọzùzù-aturu nke aturu-Ya, bú Onye- nwe-ayi Jisus,


Ma ka ntachi-obi luzue ọlu-ya, ka unu we tozue okè dizu kwa nma, buru ndi ọ dighi ihe ọ bula fọduru nke unu nēnweghi.


Ya si kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe; Ya chọ udo, b͕aso kwa ya.


Ma n'ikpe-azu, nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna-unu n'anya, ndi nwere obi ọmiko, ndi nwere uche di ume-ala:


Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n'ebube ebighi-ebi Ya nime Kraist, mb͕e unu huworo ahuhu nwa oge, Ya onwe-ya gēme ka unu zue okè, me kwa ka unu guzosie ike, me kwa ka unu di ike, tọ kwa unu ntọ-ala.


Ka amara Onye-nwe-ayi Jisus diyere ndi nsọ nile. Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan