Uwe ahu kwa, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke i gāsu, ọ buru na ihe-otiti ahu esiwo nime ha wezuga onwe-ya, agāsu kwa ya nke ub͕ò abua, ọ gādi kwa ọcha.
Otù ahu Mọ Nsọ nēye-kwa-ra adighi-ike-ayi aka: n'ihi na ayi amataghi ihe ayi gēkpe n'ekpere dika ayi nāghaghi ikpe; kama ọ bu Mọ Nsọ onwe-ya were isu-udè anāpughi ikwu nāriọrọ ayi aririọ;
Onye n'ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n'iru Onye ahu puru izọputa Ya n'ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n'ihi na Ọ turu egwu Chineke,
Echeghariwom na emewom Sọl eze: n'ihi na o siwo n'isom n'azu laghachi, ma o meghi ka okwum guzosie ike. Iwe Samuel we di ọku; o we tikue Jehova nkpu abali ahu nile.