Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 12:10 - Bible Nso

10 N'ihi nka adighi-ike nile na imem ihe-ihere nile na nkpà nile na nsob͕u nile na oké nkpà nile n'ihi Kraist dim ezi nma: n'ihi na mb͕e ọ bula m'nādighi ike, mb͕e ahu ka m'nādi ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 12:10
29 Iomraidhean Croise  

Ngọzi nādiri unu, mb͕e ọ bula madu gākpọ unu asì, mb͕e ọ bula ha gēkewapu kwa unu, ta kwa unu uta, tufu kwa aha-unu dika ajọ ihe, n'ihi Nwa nke madu.


Ma ihe ndia nile ka ha gēme unu n'ihi aham, n'ihi na ha amataghi Onye ziterem.


Ya mere ha siri n'iru nnọkọ-ikpé ahu la, nāṅuri na aguru ha na ndi kwesiri ka eme ha ihe-ihere n'ihi Aha ahu.


Ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi nime nkpab͕u-ayi nile: ebe ayi matara na nkpab͕u nāluta ntachi-obi;


Ayi onwe-ayi bu ndi-nzuzu n'ihi Kraist, ma unu onwe-unu bu ndi nwere uche nime Kraist; ayi onwe-ayi adighi ike, ma unu onwe-unu di ike; anēnye unu onwe-unu otuto, ma anēme ayi onwe-ayi ihe-ihere.


Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula.


N'ihi na onye ya onwe-ya nēme ka amara ya, ọ bughi onye ahu ka anwaputaworo, kama ọ bu onye Onye-nwe-ayi nēme ka amara ya.


Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem.


n'ihi na esitere n'adighi-ike kpọgide Ya n'obe, ma O sitere n'ike Chineke nādi ndu. N'ihi na ayi onwe-ayi bu kwa ndi nādighi ike nime Ya, ma ayi gēsite n'ike Chineke n'ebe unu nọ so Ya di ndu.


N'ihi na ayi nāṅuri ọṅu, mb͕e ọ bula ayi onwe-ayi nādighi ike, ma unu onwe-unu di ike: nka ka ayi nēkpe-kwa-ra Chineke, bú ka eme ka unu zu okè.


N'ihi na nkpab͕u-ayi nke di nfé, nke di na nwa oge a, nāluputara ayi ebube nke-uku ri nne kachasi ihe nile, bú ebube nke di arọ́ di kwa ebighi-ebi;


N'ihi na ọ bughi ayi onwe-ayi ka ayi nēkwusa, kama ọ bu Kraist Jisus, na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ayi nāsi kwa na ayi onwe-ayi bu ndi-orù-unu n'ihi Jisus.


Ọ nwu-kwa-ra n'ọnọdu madu nile, ka ndi di ndu we ghara idiri onwe-ha ndu ọzọ, kama ka ha diri Onye ahu ndu, bú Onye nwuru n'ọnọdu ha, eme kwa ka O si n'ọnwu bilie.


Ya mere ayi bu ndi-ukọ̀ n'ọnọdu Kraist, dika agāsi na Chineke nāriọ aririọ site n'aka-ayi: ayi nọ n'ọnọdu Kraist nāriọ unu, menu ka unu na Chineke di n'otù.


kama n'ihe nile ayi nēme ka madu mara ayi, dika ndi nējere Chineke ozi, nime oké ntachi-obi, nime nkpab͕u, nime nkpà, nime oké nkpà,


Nkwuwa-okwum di uku, bú nke m'ji agwa unu okwu, inya-isim n'ihi unu di uku: nkasi-obi ezuwo ezu nimem, anamaṅuribiga ókè kari na nkpab͕u-ayi nile.


Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.


n'ihi na unu ka enyeworo ya n'amara n'ihi Kraist, ọ bughi nání ikwere na Ya, kama ihu kwa ahuhu n'ihi Ya:


Ub͕u a anamaṅuri ọṅu n'ahuhu m'nāhu n'ihi unu, anamemezu kwa n'akuku nkem ihe fọduru na nkpab͕u nile nke Kraist-ayi n'anu-arum n'ihi aru-Ya, nke bu nzukọ-Ya;


ya mere ayi onwe-ayi nānya isi n'aru unu n'etiti nzukọ Chineke nile n'ihi ntachi-obi-unu na okwukwe-unu nime nsob͕u-unu nile na nime nkpab͕u nile unu nānagide;


nsob͕um nile, ahuhum nile; aha ihe dakwasirim n'Antiọk, n'Aikọniọm, na Listra; aha nsob͕u m'nagidere: Onye-nwe-ayi dọputa-kwa-ram nime ha nile.


Guanu ya n'ọṅù nile, umu-nnam, mb͕e ọ bula unu dabàra n'ọwunwa di iche iche;


i nwe-kwa-ra ntachi-obi, i bū-kwa-ra ibu n'ihi aham, ike akāgwughi kwa gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan