Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 11:6 - Bible Nso

6 Ma asi na ọ bu ezie na abum onye nāmutaghi akwukwọ n'uzọ ikwu okwu, ma abughi m otú a n'uzọ ihe-ọmuma; kama ayi mere ka ọ puta ìhè nye unu n'ihe nile ọ bula n'etiti madu nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ọ bụrụ na m abụghị onye ọka okwu, abụ m onye ọka mmụta. Anyị akọwarala unu nke a ọtụtụ mgbe nʼụzọ dị iche iche nʼihe niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 11:6
13 Iomraidhean Croise  

N'ihi na Kraist eziteghm ime baptism, kama izisa ozi ọma: ọ bughi n'amam-ihe nke okwu, ka aghara ime ka obe Kraist buru ihe-efu.


N'ihi na ebe uwa n'amam-ihe nke Chineke nējighi amam-ihe-ya mara Chineke, ọ di Chineke ezi nma iji ihe-nzuzu nke ihe ahu anēkwusa izọputa ndi kwere.


N'ihi na anēsite n'aka Mọ Nsọ nye otù onye okwu amam-ihe; anēnye kwa onye ọzọ okwu ọmuma, di ka Mọ ahu nāchọ:


Ọ bu kwa ihe ndia ka ayi nēkwu, ọ bughi n'okwu nke amam-ihe madu nēzí, kama n'okwu nke Mọ Nsọ nēzí; ayi nēwere kwa ihe nke Mọ Nsọ tule ihe nke Mọ Nsọ.


N'ihi na ha nāsi, Akwukwọ-ozi-ya di arọ́ di kwa ike; ma ọnunọ nke aru-ya n'etiti ayi adighi ike, okwu-ya bu kwa ihe akpọrọ ihe-efu.


Ewere ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube na ọlu di ike di iche iche luputa ihe-iriba-ama nile nke onye-ozi n'etiti unu ezie na ntachi-obi nile.


kama ayi juru ihe-nzuzo nile nke nēweta ihere, ayi adighi-ejeghari n'aghughọ, ayi adighi-emeso kwa okwu Chineke n'uzọ itu-ntu; kama ayi ji ngosi nke ezi-okwu nēme ka akọ-na-uche nke madu nile n'otù n'otù mara ayi n'iru Chineke.


Ya mere ebe ayi matara egwu Onye-nwe-ayi, ayi nēme ka madu kweye, ma emewo ka ayi puta ìhè nye Chineke; anamatukwasi kwa obi na emewo ka ayi puta kwa ìhè nime akọ-na-uche-unu.


nime idi-ọcha, nime ihe-ọmuma, nime ogologo ntachi-obi, nime obi-ọma, nime Mọ Nsọ, nime ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya,


Nyenu ayi uzọ n'obi-unu; ayi emeghi onye ọ bula ajọ omume, ayi emebighi onye ọ bula, ayi erib͕ughi onye ọ bula.


nke unu gēji pu ihuta nghọtam n'ihe-omimi nke Kraist, mb͕e unu guru ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan