Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 11:31 - Bible Nso

31 Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus, Onye bu onye agọziri agọzi rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọ matara na ekwughi m okwu-ugha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Chineke, na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs, onye e kwesiri ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi, maara na ihe ndị a niile m na-ekwu bụ eziokwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 11:31
22 Iomraidhean Croise  

Ndi Livai, bú Jeshua, na Kadmiel, na Bani, na Hashabneia, na Sherebia, na Hodia, na Shebania, na Petahia, we si, Bilienu, gọzie Jehova, bú Chineke-unu, site na mb͕e edighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi: ka ha gọzi kwa aha-Gi di nsọpuru, nke ebuliworo ya elu kari ngọzi na otuto nile.


Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. Amen, na Amen.


Jisus si ya, Emetulam aka; n'ihi na akāmarigogh lakuru Nnam: ma gakwuru umu-nnam, si ha, Anamarigo lakuru Nnam na Nna-unu, na Chinekem na Chineke-unu.


ebe ha were ezi-okwu nke Chineke b͕anwere ugha-ha, ha we sọpuru nēkpe-kwa-ra ihe ekère èkè kama Onye kère èkè, Onye agọziworo ebighi-ebi. Amen.


N'ihi na Chineke, Onye m'nēkpere nime mọm n'ozi ọma nke Ọkpara-Ya, bu Onye-àmàm, otú m'nārapughi aka n'ihota unu,


ka unu we ji otù obi ji kwa otù olu nēnye Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist otuto.


Anamekwu ezi-okwu nime Kraist, ekwughi m okwu-ugha, akọ-na-uchem nēsokwam b͕a àmà nime Mọ Nsọ,


ndi nwe nna-ayi-hà, ndi Kraist-ayi si kwa n'etiti ha puta dika anu-aru si di, Onye bu Onye-isi ihe nile, bu kwa Chineke, Nke agọziworo rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Ma mu onwem nākpọku Chineke ka Ọ buru onye-àmà megide nkpuru-obim, na ọ bu n'imere unu ebere ka m'nējighi bia Kọrint rue ub͕u a.


Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke obi-ebere nile na Chineke nke nkasi-obi nile;


N'ìhi gini? ọ̀ bu n'ihi na ahughi m unu n'anya? Chineke matara.


Ma ihe ndia nke m'nēdegara unu, le, n'iru Chineke, na ekwughm okwu-ugha.


Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye were ngọzi nile ọ bula nke Mọ Nsọ gọzie ayi n'ebe di n'elu-igwe nime Kraist:


Ọ bu n'ihi nka ka m'ji b͕ue ikperèm abua n'ala nye Nna-ayi,


Ayí nēkele Chineke, bú Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nēkpe ekpere bayere unu mb͕e nile,


N'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ahuru ayi n'ikwu okwu nrafu, dika unu matara, ma-ọbu n'iwere aghughọ b͕achita anya-uku, Chineke bu onye-àmà;


dika ozi ọma nke ebube nke Chineke di ngọzi si di, nke enyere mu onwem n'aka na ntukwasi-obi idebe.


Ma Eze nke mb͕e nile, Nke anāpughi imebi emebi, Nke anāpughi ihu anya, Onye nání Ya bu Chineke, nsọpuru na otuto diri Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Onye nání Ya nwere anwughi-anwu, nēbi nime ìhè nke anāpughi ibiaru nso; Onye ọ dighi madu ọ bula huworo Ya anya, ma-ọbu pu ihu Ya anya: Onye nsọpuru na ike ebighi-ebi diri. Amen.


Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye muru ayi ọzọ, dika oké ebere-Ya si di, ka ayi we nwe olile-anya di ndu, site na nbilite ahu nke Jisus Kraist si na ndi mwuru anwu bilite,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan