24 Ub͕ò ise ka ndi-Ju piaram otù adighi n'ọgu ube-utari abua.
24 Ugboro ise ka ndị Juu pịara m ọnụ ụtarị iri anọ e wepụrụ otu.
Ma nēzenu madu: N'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche, n'ulo-nzukọ nile ha ka ha gāpia kwa unu ihe;
Ma unu onwe-unu lezie anya n'onwe-unu: n'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche; n'ulo-nzukọ di iche iche ka agāpia kwa unu ihe; n'iru ndi-isi na ndi-eze ka unu gēguzo kwa n'ihim, iburu ha àmà.
Ọzọ, orù ahu, nke mara ihe onye-nwe-ya chọrọ, ma o dozighi, o meghi kwa dika ọ chọrọ, agāpia ya ọtutu utari;