Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 11:22 - Bible Nso

22 Hà bu ndi-Hibru? mu onwem bu kwa. Hà bu ndi Israel? mu onwem bu kwa. Hà bu nkpuru Abraham? mu onwem bu kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ha bụ ndị Hibru? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị Izrel? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị agbụrụ Ebraham? Mụ onwe m bụkwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 11:22
17 Iomraidhean Croise  

Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke-ayi, napuru ndi bi n'ala nka ala-ha n'iru ndi-Gi, bú Israel, were ya nye nkpuru Abraham, bú onye nāhu Gi n'anya, rue mb͕e ebighi-ebi?


Moses na Eron we bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Rùe ole mb͕e i gāju iweda onwe-gi n'ala n'irum? zipu ndim, ka ha we fèm.


Ha gēge kwa nti n'olu-gi: i gābiakute kwa eze Ijipt, gi onwe-gi na ndi-okenye Israel, unu gāsi kwa ya, Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, ezutewo ayi: ub͕u a kwa, biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n'ọzara, ka ayi we chuara Jehova, bú Chineke-ayi, àjà.


Ha si, Chineke nke ndi-Hibru ezutewo ayi: biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n'ọzara, chuara Jehova, bu Chineke-ayi, aja: ka Ọ we ghara iwere ajọ ọria nēfe efe, ma-ọbu mma-agha, zute ayi.


I gāsi kwa ya, Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, O zìwom biakute gi, si, Zipu ndim, ka ha we fèm n'ọzara: ma, le, i nughi rue ub͕u a.


Jehova we si Moses, Bakuru Fero, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.


Jehova we si Moses, Bilie n'isi-ututu, guzo onwe-gi n'iru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.


unu echè-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia.


Mu onwem bu onye-Ju, nke amuru na Tasọs nke Silisia, ma azùputaram n'obodo a, n'ukwu Gameliel, ezíwo mu ihe, dika esi edebezu iwu nke nna-ayi-hà, obim nānu ọku nye Chineke, dika unu onwe-unu nile di ta:


Ma na mb͕e ahu, mb͕e ndi nēso uzọ Jisus nāba uba, ndi-Ju nāsu asusu Grik malitere itamu megide ndi-Hibru, n'ihi na elefuru ndinyom-ha ndi di-ha nwuru anya n'ije-ozi, bú ikère ndi Kraist òkè, kwa-ubọchi.


Ya mere asim, Ọ̀ gābu na Chineke nupuru ndi nke Ya? Chineke ekwela. N'ihi na mu onwem bu kwa onye Israel, si na nkpuru Abraham puta, si kwa n'ebo Benjamin puta.


ebe ha bu ndi Israel; ndi nwe ido-ka-nwa-nwoke ahu, na ebube ahu, na ọb͕ub͕a-ndu nile, na inye-iwu ahu, na ikpe ekpere ahu n'ulo uku Chineke, na nkwa nile;


Ma ọ bu Abraham ka ekwere nkwa ndia, ya na Nkpuru-ya. Ọ sighi, Na nkpuru, dika Ọ nēkwu okwu bayere ọtutu; kama dika Ọ nēkwu okwu bayere otù Onye, Ọ si, Na Nkpuru-gi, Nke bu Kraist.


ebìrim úgwù n'ubọchi nke-asatọ, esiterem n'umu Israel, site kwa n'ebo Benjamin, abum onye-Hibru nke sitere na ndi-Hibru; n'akuku iwu, abumri onye-Farisi;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan