Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 11:15 - Bible Nso

15 Ya mere ọ bughi ihe uku ma asi na ndi nējere ya ozi nēme kwa onwe-ha ka ha yie ndi nēje ozi ezi omume; ndi ọgwugwu-ha gādi ka ọlu-ha si di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ya ozi emee onwe ha dịka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nʼọgwụgwụ oge, ha ga-anata ụgwọ dịka ọrụ ha si dị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 11:15
30 Iomraidhean Croise  

Ndi-orù-ya we biarue nso, gwa ya okwu, si, Nnam, asi na ọ bu ihe uku onye-amuma gwara gi me, ì gaghi-eme ya? ì gēsi kwa aṅa ghara ime ya mb͕e ọ siri gi, Sa aru, di kwa ọcha?


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iji nmehie Shemaia onye-Nehelamait leta ya, leta kwa nkpuru-ya; ọ gaghi-enwe nwoke ọ bula nēbi n'etiti ndi nka, ọ gaghi-elekwasi kwa ezi ihe ahu anya, bú nke Mu onwem nēmere ndim, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na okwu nwezuga ka o kwuworo megide Jehova.


ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n'aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n'anya: ma gini ka unu gēme n'ikpe-azu-ya?


N'ihi na unu ji okwu-ugha mebie obi onye ezi omume, ma Mu onwem emeghi ka o b͕ue ya nb͕u; na n'ihi na unu mere ka aka abua nke onye nēmebi iwu di ike, ka o we ghara isi n'uzọ ọjọ ya lata, ime ka ọ di ndu:


si, Gi onye juputara n'aghughọ nile na ihe nile jọb͕uru onwe-ya, gi nwa ekwensu, gi onye-iro ezi omume nile, ì gaghi-arapu ikwahie uzọ nile eguzoziri nke Onye-nwe-ayi?


Onye gēnyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya nile si di:


gini me-kwa-ra ayi asighi, Ka ayi me ihe ọjọ, ka ezi ihe we puta? (dika anēkwulu ayi, dika ufọdu nēkwu kwa na ayi nāsi), ndi ikpé-ha ziri ezi.


Ọ buru na ayi onwe-ayi ghara ihe nke Mọ Nsọ dika nkpuru nye unu, ọ̀ bu ihe uku ma ọ buru na ayi onwe-ayi gēwere ihe nke anu-aru unu dika ihe-ubi?


N'ihi na madu di otú a bu ndi-ozi ugha, ndi-ọlu nātu ntu, ndi nēme onwe-ha ka ha yie ndi-ozi Kraist.


Hà bu ndi nējere Kraist ozi? (anamekwu dika onye anya nādighi nma) mu onwem nēje kari; anamadọb͕ubiga onwem ókè n'ọlu kari, anamanọbiga ókè n'ulo-nkpọrọ kari, anāpiam utari nke-uku ri nne, anọm n'ọnu ọnwu ọtutu mb͕e.


N'ihi na asi na ije-ozi nke ọmuma-ikpé bu ebube, ije-ozi nke ezi omume gēnwebiga ebube ókè kari nke-uku.


N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe.


ndi ọgwugwu-ha bu ila-n'iyì, ndi chi-ha bu afọ-ha, ndi otuto-ha di kwa n'ihere-ha, ndi nātukwasi uche n'ihe uwa.


Nime anya-uku ka ha gēji kwa okwu nrafu di iche iche were unu zua ahia: ndi ọmuma-ikpe-ha nābughi ihe nādighi-alu ọlu site n'oge ochie, ila-n'iyì-ha adighi-atu kwa ura.


N'ihi na madu ufọdu b͕ebàra, bú ndi ewereworo ha gosi ọra madu mb͕e ochie ka ewe ma ha ikpé a, ndi nādighi-asọpuru Chineke, ndi nāgha amara Chineke-ayi ka ọ buru agu ikwa-iko, ndi nāgọnari kwa Onye nání Ya bu Nna-nwe-ọra, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.


O we nēduhie ndi bi n'elu uwa n'ihi ihe-iriba-ama nile nke enyere ya ike ime n'iru anu-ọhia ahu; nāsi ndi bi n'elu uwa, ka ha kpuara anu-ọhia ahu ihe-oyiyi, bú nke nwere ob͕ub͕u-mma-agha ahu, we di ndu.


Anu-ọhia nke m'huru yi-kwa-ra agu, ukwu-ya di kwa ka ukwu bear, ọnu-ya di kwa ka ọnu ọdum: dragon ahu we nye ya ike-ya, na oche-eze-ya, na oké ichi-isi.


Ha nwere mọ-ozi ahu nke abyss ahu dika eze-ha: aha-ya n'asusu Hibru bu Abadon, n'asusu Grik o nwe-kwa-ra aha Apọlion.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan