Ọ si ya nke ub͕ò atọ, Saimon, nwa Jọn, àbum eyì-gi? O wutara Pita na Ọ siri ya nke ub͕ò atọ, Àbum eyì-gi? O we si Ya, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi matara ihe nile; Gi onwe-gi mara na I bu eyìm. Jisus si ya, Nēnye aturum nri.
Ma mu onwem gēwere obi-utọ nile mefu ihe m'nwere kwe kwa ka emefusia mu onwem n'ihi nkpuru-obi-unu. Ọ buru na anamahubiga unu n'anya ókè kari, ànāhum n'anya nke-ntà kari?
N'ihi na ayi adighi ka ọra madu, ndi were ihe nādighi nma nētigwa n'okwu Chineke: kama dika ndi sitere n'idi-ọcha, kama dika ndi sitere na Chineke, ọ bu n'iru Chineke, nime Kraist ka ayi nēkwu.
Ọ dighi kwa ihe ekère èkè nke nāputaghi ihè n'iru Ya: kama ihe nile b͕a ọtọ buru kwa ihe emegheworo n'anya-Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ bayere omume-ayi.
Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, Ya onwe-ya mara, Israel kwa, ya onwe-ya gāmara; ọ buru na ọ bu nime nnupu-isi, ọ buru kwa na ọ bu nime nmekpu megide Jehova, (azọputala ayi ta,)
M'gēwere kwa ọnwu b͕ue umu-ya; nzukọ Kraist nile gāmara kwa na Mu onwem bu onye nēnyocha akuru na obi nile: M'gēnye kwa unu n'otù n'otù dika ọlu nile unu si di.