Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 10:18 - Bible Nso

18 N'ihi na onye ya onwe-ya nēme ka amara ya, ọ bughi onye ahu ka anwaputaworo, kama ọ bu onye Onye-nwe-ayi nēme ka amara ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Nʼihi na ọ bụghị onye ji aka ya bulie onwe ya elu ka a na-anabata, kama ọ bụ onye Onyenwe anyị jiri aka ya bulie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 10:18
21 Iomraidhean Croise  

Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda.


Uzọ ọ bula nke onye ọ bula ziri ezi n'anya-ya abua: Ma onye nātùzi obi nile ka Jehova bu.


Ka onye ala ọzọ to gi, ma ọ bughi ọnu-gi; Ka onye mba ọzọ to gi, ma ekwela ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua to gi.


O we si ha, Unu onwe-unu bu ndi nāgu onwe-unu na ndi ezi omume n'anya madu; ma Chineke mara obi-unu: n'ihi na ihe di elu n'etiti madu bu ihe-árú n'anya Chineke.


n'ihi na ha huru otuto madu n'anya kari otuto Chineke.


Ndikom nke Israel, nurunu okwu ndia: Jisus Onye Nazaret, bú Nwoke Nke Chineke gosiworo unu site n'ọlu di ike na ọlu-ebube na ihe-iriba-ama, nke Chineke mere site n'aka-Ya n'etiti unu, dika unu onwe-unu matara:


N'ihi na onye nābu orù Kraist n'uzọ nka, ọ di Chineke ezi utọ, buru kwa onye anwaputara n'iru madu.


Kelenu Apelis onye anwaputaworo nime Kraist. Kelenu ndi sitere n'èzí-na-ulo nke Aristọbulọs.


kama onye nke bu onye-Ju n'ihe zoro ezo, onye ahu bu onye-Ju; obibì-úgwù bu kwa nke nkpuru-obi, nime mọ, ọ bughi n'ihe edeworo n'akwukwọ; nke otuto-ya nēsiteghi n'aka madu, kama o sitere n'aka Chineke.


N'ihi na irọ-òtù di iche iche aghaghi idi kwa n'etiti unu, ka ndi anwaputaworo we ghọ ndi putara ìhè n'etiti unu.


Ya mere, unu ekpela ihe ọ bula ikpé mb͕e oge ahu akērughi, rue mb͕e ọ bula Onye-nwe-ayi gābia, Onye gēweputa kwa ihe nile ezoro ezo nke ọchichiri n'ìhè, me kwa ka ìzù nile nke obi nile puta ìhè; mb͕e ahu ka madu nile n'otù n'otù gēnwe kwa otuto-ha site n'aka Chineke.


N'ihi na ayi enweghi anya-ike igu onwe-ayi n'etiti ufọdu, ma-ọbu iwere onwe-ayi tule ha, bú ufọdu ndi ahu ndi ha onwe-ha nēme ka amara ha: ma ebe ha nēwere onwe-ha tù onwe-ha, were kwa onwe-ha tule onwe-ha, ha onwe-ha aghọtaghi ihe.


Ma ayi nēkpere Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọ ọ bula; ọ bughi ka ayi onwe-ayi we puta ìhè, na ayi bu ndi anwaputara, kama ka unu onwe-unu we nēme ihe ọma, ka ayi onwe-ayi we di kwa ka ndi ajuru aju.


Àyi nāmalite ọzọ ime ka madu mara ayi? ma-ọbu ǹkpà akwukwọ-ozi ime ka madu mara ayi nākpa ayi inye unu ma-ọbu inara unu, dika ọ nākpa ufọdu?


Ayi adighi-eme ọzọ ka unu mara ayi, kama ayi nēkwu dika ndi nēnye unu oghere inya isi n'ihi ayi, ka unu we nwe ihe iza ndi nānya isi n'ihe anāhu anya, ọ bughi kwa n'obi.


kama n'ihe nile ayi nēme ka madu mara ayi, dika ndi nējere Chineke ozi, nime oké ntachi-obi, nime nkpab͕u, nime nkpà, nime oké nkpà,


Nānu ọku n'obi iche onwe-gi n'iru madu dika onye Chineke nwaputaworo, onye-ọlu nke ihere nāpughi ime ya, onye nēkwuzi okwu nke ezi-okwu ahu.


ka nnwaputa nke okwukwe-unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n'iyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru nime nkpughe nke Jisus Kraist:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan