Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Kọrint 1:23 - Bible Nso

23 Ma mu onwem nākpọku Chineke ka Ọ buru onye-àmà megide nkpuru-obim, na ọ bu n'imere unu ebere ka m'nējighi bia Kọrint rue ub͕u a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ana m akpọku Chineke dịka onye akaebe m, ọ bụ nʼihi ịnapụta unu mere m ji hapụ ịbịa Kọrint.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Kọrint 1:23
22 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ihe ndia gasiri o si n'Atens pua, bia rue Kọrint.


Krispọs, onye-isi ulo-nzukọ, we kwere n'Onye-nwe-ayi, ya na èzí-na-ulo-ya dum; ọtutu madu n'etiti ndi Kọrint we kwere mb͕e ha nuru, ewe me ha baptism.


N'ihi na Chineke, Onye m'nēkpere nime mọm n'ozi ọma nke Ọkpara-Ya, bu Onye-àmàm, otú m'nārapughi aka n'ihota unu,


Anamekwu ezi-okwu nime Kraist, ekwughi m okwu-ugha, akọ-na-uchem nēsokwam b͕a àmà nime Mọ Nsọ,


Gini ka unu nāchọ? ọ̀ bu utari ka m'gēwere biakute unu, ma-ọbu ihu-n'anya na mọ nke idi-nwayọ?


irara onye di otú a nye n'aka Setan ibibi anu-aru-ya, ka ewe zọputa mọ-ya n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus.


Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi, nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, ha na ndi nsọ nile ndi nọ n'Akaia dum:


Ma dika Chineke kwesiri ntukwasi-obi, okwu-ayi nke ayi gwara unu abughi e na é-è.


ma ariọm unu, ka m'ghara inwe obi-ike mb͕e m'nọ n'etiti unu na ntukwasi-obi ahu nke m'nāgu na m'gēji nwe anya-ike imegide ufọdu, ndi nāgu ayi dika ndi nējeghari dika anu-aru-ayi si chọ.


Dika ezi-okwu nke Kraist di nimem, agaghi-eb͕ochi inya-isi a nimem n'akuku nile nke Akaia.


N'ìhi gini? ọ̀ bu n'ihi na ahughi m unu n'anya? Chineke matara.


Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus, Onye bu onye agọziri agọzi rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọ matara na ekwughi m okwu-ugha.


N'ihi na anamatu egwu, ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia, m'gāhu unu ka unu nābughi aha madu ahu m'nāchọ, unu ahú kwa mu onwem ka m'nābu aha madu unu ṅachọghi; ma o nwere uzọ ọ bula esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkwutọ, ntakwu, nfuli-elu, aghara, gādi;


N'ihi nka ka m'nēde ihe ndia n'akwukwọ mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, ka m'we ghara iwere ihe-ike meso unu mb͕e m'nọ n'etiti unu, dika ike nke Onye-nwe-ayi nyerem si di, iwuli elu dika ulo, ọ bughi kwa ikwada akwada.


Agwawom ha n'oge gara aga, anamebu kwa uzọ gwa ha, bú ndi mehieworo n'oge gara aga, na ndi nile fọduru, dika mb͕e m'nọ n'etiti unu ub͕ò nke-abua, ub͕u a kwa, mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, si, na, ọ buru na abiam ọzọ, m'gaghi-eme ebere;


nime idi-ọcha, nime ihe-ọmuma, nime ogologo ntachi-obi, nime obi-ọma, nime Mọ Nsọ, nime ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya,


Ma ihe ndia nke m'nēdegara unu, le, n'iru Chineke, na ekwughm okwu-ugha.


N'ihi na Chineke bu onye-àmà nkem, otú agu unu nile nāgusim ike n'obi-ebere nke Kraist Jisus.


N'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ahuru ayi n'ikwu okwu nrafu, dika unu matara, ma-ọbu n'iwere aghughọ b͕achita anya-uku, Chineke bu onye-àmà;


ndi Haimeniọs na Aleksanda nọ n'etiti ha; ndi m'rara nye n'aka Setan, ka ewe site n'ahuhu zí ha ka ha ghara ikwulu Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan