Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 9:24 - Bible Nso

24 Jihu we dọtia uta-ya ka aka-ya ra, b͕ata Jehoram n'ab͕ata ogwe-aka-ya abua, àkú we si n'obi-ya puta, o we ruru ala n'ub͕ọ-ala-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Jehu jiri ike ya niile dọtịa ụta o ji nʼaka ya gba ya Joram. Ọ gbatara Joram àkụ ahụ nʼazụ. Àkụ ahụ sikwa ya nʼobi pụta. Nke a mere ka Joram daa nʼime ụgbọala ya nwụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 9:24
12 Iomraidhean Croise  

Ọ gēru kwa, na onye nēwepuga onwe-ya na mma-agha Hazael, Jihu gēme ka ọ nwua: onye nēwepuga kwa onwe-ya na mma-agha Jihu, Elaisha gēme ka ọ nwua.


Ì huwo na Ehab ewedawo onwe-ya n'ala n'irum? n'ihi na o wedawo onwe-ya n'ala n'irum, M'gaghi-eme ka ihe ọjọ ahu bia n'ubọchi-ya: ọ bu n'ubọchi nwa-ya ka M'gēme ka ihe ọjọ ahu biakwasi ulo-ya.


Ma otù nwoke dọrọ uta-ya nāmaghi onye ọ bu, we b͕ata eze Israel n'etiti njikọ ihe-agha-ya na uwe-agha-ya: o we si onye-ub͕ọ-ala-ya, Chigharia aka-gi, me ka m'si n'ọmuma-ulo-ikwū pua; n'ihi na ọria nāriam.


Agha we la elu n'ubọchi ahu: ewe me ka eze guzogide n'ub͕ọ-ala-ya imegide Siria, o we nwua n'anyasi: ọbara ebe ab͕aruru ya aru we b͕apu ba n'etiti ub͕ọ-ala-ya.


Ha we tua egwu nke-uku ri nne, si, Le, eze abua eguzoghi n'iru ya: àyi onwe-ayi gēsi kwa aṅa guzo?


O rue, n'ututu, na ọ puru, guzo, si ndi Israel nile, Ndi ezi omume ka unu bu: le, mu onwem kekọtara madu imegide onye-nwem, b͕ue ya: ma ònye tib͕uru ndia nile?


Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke, Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu:


Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.


Agāsi kwa ya, Gini bu ntiputa-ọnyá ndia n'etiti aka-gi abua? Ọ gāsi kwa, Ha bu ọnyá etiputaram n'ulo ndi nāhum n'anya.


Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan