Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 9:18 - Bible Nso

18 Onye-nnọkwasi-inyinya we je izute ya, si, Otú a ka eze siri. Ùdo di kwa? Jihu we si, Gini ka gi na udo nwekọrọ? chigharia ga n'azum. Onye-nche ahu we gosi, si, Onye-ozi-ayi biakutere ha, ma ọ lataghi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Onye ọgbaịnyịnya ahụ nọkwasịrị nʼelu ya gbapụ izute Jehu, sị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ” Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Tụgharịa gaa soro m nʼazụ.” Onye nche ahụ ziri ozi sị, “Onyeozi ahụ ezutela ha, kama ọ naghị alọta.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 9:18
8 Iomraidhean Croise  

Ma onye-nche nēguzo n'elu ulo-elu na Jezreel, ọ hu ìgwè ndi Jihu mb͕e ọ nābia, ọ si, Ìgwè madu ka m'nāhu. Jehoram we si, Were onye-inyinya, ziga izute ha, ya si kwa, Ùdo di kwa?


O we zipu onye-nnọkwasi-inyinya nke-abua, ọ biakute ha, si, Otú a ka eze siri, Ùdo di kwa? Jihu we si, Gini ka gi na udo nwekọrọ? chigharia ga n'azum.


O rue, mb͕e Jehoram huru Jihu, na ọ siri, Ùdo di kwa, Jihu? Ọ si, Gini bu udo ahu, na mb͕e ikwa-iko Jezebel, bú nne-gi, na mb͕asi-ya nādi ọtutu?


Mb͕e Jihu bara n'ọnu-uzọ-ama, nwayi ahu siri, Ùdo di kwa, Zimri, ob͕u onye-nwe-ya?


Ọ dighi udo diri ndi nēmebi iwu, ka Jehova siri.


Uzọ udo ka ha nāmaghi; ọ dighi kwa ikpé ziri ezi di n'uzọ nile ha: ha emewo ka okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ha ab͕agọ; onye ọ bula nke nāzọ ije na ya adighi-ama udo.


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Abala n'ulo nke ikwa-ozu, eje-kwa-la iti aka n'obi, egosi-kwa-la ha ebere i nwere n'aru ha: n'ihi na ewepuwom udom n'ebe ndi nka nọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ebere na obi-ebere nile.


Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan