Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 9:11 - Bible Nso

11 Jehu we pukute ndi-orù onye-nwe-ya: otù onye we si ya, Ùdo di kwa? gini mere onye a nke nāwi ara biakutere gi? Ọ si ha, Unu onwe-unu amawo nwoke ahu na nkpari-uka-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Jehu jekwuuru ndịisi agha ibe ya. Otu onye nʼime ha jụrụ ya sị, “Gịnị ka onye ara ahụ chọrọ bịa? Udo ọ dịkwa?” Jehu zara, “Unu maara onye ọ bụ, marakwa ụdị okwu ga-esi ya nʼọnụ pụta.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 9:11
16 Iomraidhean Croise  

biko, b͕a ọsọ izute ya ub͕u a, si ya, Ì nọ n'udo? di-gi, ọ̀ nọ n'udo? nwa-gi, ọ̀ nọ n'udo? Ọ si, Ayi nọ n'udo.


Gihezi we chuso Neaman. Neamam we hu otù onye nāb͕aso ya, o we si n'ub͕ọ-ala-ya rida izute ya, si, Ùdo di kwa?


Ha si, Ọ bu okwu-ugha; biko, gosi ayi. Ọ si, Otú a na otú a ka ọ gwaram, si, Otú a ka Jehova siri, Etewom i manu ibu eze Israel.


Ma onye-nche nēguzo n'elu ulo-elu na Jezreel, ọ hu ìgwè ndi Jihu mb͕e ọ nābia, ọ si, Ìgwè madu ka m'nāhu. Jehoram we si, Were onye-inyinya, ziga izute ha, ya si kwa, Ùdo di kwa?


O we zipu onye-nnọkwasi-inyinya nke-abua, ọ biakute ha, si, Otú a ka eze siri, Ùdo di kwa? Jihu we si, Gini ka gi na udo nwekọrọ? chigharia ga n'azum.


Mb͕e i biara ebe ahu, gi hu Jihu nwa Jehoshafat nwa Nimshi anya n'ebe ahu, ba nime, me ka o bilie site n'etiti umu-nne-ya, me kwa ka ọ ba n'ime-ulo di n'ime-ulo.


O rue, mb͕e Jehoram huru Jihu, na ọ siri, Ùdo di kwa, Jihu? Ọ si, Gini bu udo ahu, na mb͕e ikwa-iko Jezebel, bú nne-gi, na mb͕asi-ya nādi ọtutu?


E, ezi-okwu aghọwo ihe anāhughi; ọzọ, onye nēsi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya nēme onwe-ya ihe-nkwata: Jehova we hu ya, ọ jọ njọ n'anya-Ya na ikpé ziri ezi adighi.


Jehova emewo gi onye-nchu-àjà n'ọnọdu Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, ka ndi-nlekọta we di n'ulo Jehova, imeso onye ọ bula nāwi ara, nke nēme kwa onwe-ya onye-amuma, ka i we tiye ya n'ọtọsi na nime nkpọrọ olu.


Ubọchi nile nke nleta abiawo, ubọchi nkwughachi abiawo; Israel gāma ya: onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka onye-amuma bu, onye-ara ka onye nwere Mọ Chineke bu, n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, na n'ihi na ihe bara uba ka ikpọ-asì ahu bu.


Mb͕e ndi-ikwu-Ya nuru ya, ha we pua ijide Ya: n'ihi na ha nāsi, Anya adighi Ya nma.


Ọtutu nime ha we si, O nwere mọ ọjọ, anya adighi kwa Ya nma; gini mere unu nānu olu-Ya?


Ufọdu kwa nime ndi-Epikurean na ndi-Stoik, bú ndi nāhu amam-ihe n'anya, we zute ya. Ufọdu we si, Gini ka onye-ekwukwu a nāchọ ikwu? ndi ọzọ nāsi kwa, Ọ di ka onye nēkwusa ndi-mọ nke ala ọzọ: n'ihi na ọ nēzisa ozi ọma nke Jisus na nbilite-n'ọnwu-Ya.


Mb͕e ọ nāgọpu onwe-ya otú a, Festọs were oké olu si, Pọl, anya adighi gi nma; oké nmuta-akwukwọ-gi nēme gi ka i ghọ onye anya nādighi nma.


Ayi onwe-ayi bu ndi-nzuzu n'ihi Kraist, ma unu onwe-unu bu ndi nwere uche nime Kraist; ayi onwe-ayi adighi ike, ma unu onwe-unu di ike; anēnye unu onwe-unu otuto, ma anēme ayi onwe-ayi ihe-ihere.


N'ihi na asi na ayi buru ndi anya nādighi nma, ọ bu n'ebe Chineke nọ; asi kwa na ayi nwere uche zuru okè, ọ bu n'ebe unu nọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan