Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 8:19 - Bible Nso

19 Ma Jehova ekweghi ibibi Juda, n'ihi Devid, bú orù-Ya, dika Ọ siri ya na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ma nʼagbanyeghị nke a, nʼihi ohu ya bụ Devid Onyenwe anyị achọghị ibibi Juda. Nʼihi na o kwere nkwa ime ka oriọna dịịrị Devid na ụmụ ụmụ ruo mgbe ebighị ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 8:19
18 Iomraidhean Croise  

Ma Abishai nwa Zeruaia yere ya aka, tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua. Mb͕e ahu ndikom Devid ṅuru ya iyi, si, I gaghi eso ayi pua ibu agha ọzọ, ka i ghara imenyu oriọna Israel.


ma eberem agaghi-esi n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya, dika M'wēzugara ya n'ebe Sọl nọ, onye M'wezugara n'iru gi.


Ma ulo-gi na ala-eze-gi gēkwesi ntukwasi-obi n'iru gi rue mb͕e ebighi-ebi: agēme ka oche-eze-gi buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi.


Ọ bu nání na ọ bughi n'ubọchi-gi ka M'gēme ya, n'ihi Devid, bú nna-gi: ọ bu n'aka nwa-gi ka M'gādọwapu ya.


Otú ọ di, ọ bughi ala-eze-gi nile ka M'gādọwapu; otù ebo ka M'gēnye nwa-gi, n'ihi Devid, bú orùm, na n'ihi Jerusalem, nke M'rọputaworo.


Ma nwa-ya ka M'gēnye otù ebo, ka Devid, bú orùm, we nwe oriọna ubọchi nile n'irum na Jerusalem, bú obodo nke M'rọputaworo Onwem itiye aham n'ebe ahu.


Ma Jehosheba, nwa-nwayi eze, bú Joram, nwa-nne-nwayi Ehazaia, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina; ha we zopu ya n'iru Atalaia, ewe ghara ime ka ọ nwua.


M'gēb͕ochi kwa obodo a izọputa ya, n'ihi Onwem, na n'ihi Devid, bú orùm.


Ma Jehova ekweghi ibibi ulo Devid, n'ihi ọb͕ub͕a-ndu ahu Ya na Devid mere, dika Ọ si-kwa-ra na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile.


N'ihi Devid, bú orù-Gi, Atugharila iru onye-Gi etere manu.


N'ebe ahu ka M'gēme ka mpi Devid nwere pue: Edoworom onye nkem etere manu oriọna n'usoro.


M'gēb͕ochi kwa obodo a izọputa ya, n'ihi Onwem, na n'ihi Devid, bú orùm.


N'ihi nka Onye-nwe-ayi onwe-ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le, nwa-ab͕ọghọ ahu di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel.


M'gaghi-emezu idi-ọku nke iwem, M'gaghi-alaghachi ibibi Efraim: n'ihi na Chineke ka M'bu, abughm madu; n'etiti gi ka Mu, bú Onye nsọ, nọ: M'gaghi-abata kwa n'obodo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan