Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 8:1 - Bible Nso

1 Ma Elaisha gwara nwayi ahu okwu, bú onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu, si, Bilie, je, gi onwe-gi na ulo-gi, nọ dika ọbìa n'ebe ọ bula i gānọ dika ọbìa: n'ihi na Jehova akpọwo oké unwu ka ọ da: ọzọ kwa, ọ gābiakwasi ala arọ asa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ịlaisha gwara nwanyị ahụ o mere ka nwa ya si nʼọnwụ bilie okwu sị ya, “Bilie, gị na ezinaụlọ gị, gaa nʼobodo ọzọ ebe unu ga-anọ dịka ọbịa nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na oke ụnwụ ga-adakwasị ala Izrel afọ asaa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 8:1
31 Iomraidhean Croise  

Oké unwu we di n'ala ahu: Abram we ridarue Ijipt inọ n'ebe ahu dika ọbìa; n'ihi na oké unwu ahu di ike n'ala.


Oké unwu we di n'ala ahu, tukwasi oké unwu mbu nke di n'ubọchi Abraham. Aisak we jekuru Abimelek, bú eze ndi Filistia, rue Gera.


Josef we si Fero, Nrọ, Fero, otù ka ọ bu: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka O gosiworo Fero.


Ma ihe kpatara eji me ka nrọ ahu di okpukpu abua nye Fero, ọ bu n'ihi na emewo ka okwu ahu guzosie ike site n'ebe Chineke nọ, Chineke nēme kwa ngwa ime ya.


Arọ asa ahu nke oké unwu we malite ibia, dika Josef siri; oké unwu we di n'ala nile; ma nri di n'ala Ijipt nile.


Ha we si Fero, Inọ dika ọbìa n'ala nka ka ayi biaworo; n'ihi na ọ dighi ihe eji azù ìgwè ewu na aturu ahu nke ndi-orù-gi nwere; n'ihi na oké unwu a di arọ́ n'ala Kenean: ub͕u a kwa, biko, ka ndi-orù-gi biri n'ala Goshen.


Oké unwu we di n'ubọchi Devid arọ atọ n'usoro, arọ na arọ; Devid we chọ iru Jehova. Jehova we si, Ọ bu n'ihi Sọl na n'ihi ulo ọbara ya, n'ihi na o mere ka ndi Gibeon nwua.


Gad we biakute Devid, si, ya, Ọ̀ bu oké unwu arọ asa gābiakute gi n'ala-gi? mà-ọbu na i ganāb͕alaga n'iru ndi nākpab͕u gi ọnwa atọ, mb͕e ndi ahu nāchu gi: mà-ọbu na ajọ ọria nēfe efe gādi n'ala-gi ubọchi atọ? ub͕u a mata, le kwa okwu m'gēweghachiri Onye nēzitem.


Elaija, bu onye Tisbe, onye sitere na ndi-nnọdu nke Gilead, we si Ehab, Jehova, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agaghi-adi ma-ọli n'arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di.


Elaija we je ime ka Ehab hu ya anya. Ma oké unwu ahu siri ike na Sameria.


Nwata ahu we toputa, ubọchi we rue, na ọ pukuru nna-ya jekuru ndi nēbì ọka.


Ọ kpọ Gihezi, si, Kpọ nwayi Shunem nka. Ọ kpọ ya. Nwayi ahu we bakute ya, ọ si, Kuru nwa-gi.


Ma Elaisha biaghachiri rue Gilgal: ma oké unwu di n'ala ahu; umu ndi-amuma nānọdu kwa ala n'iru ya: o we si nwa-okorọbia-ya, Tukwasi ite uku n'ọku, siere umu ndi-amuma ofé.


o we diri ya otú a; ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n'ọnu-uzọ-ama, ọ nwua.


Nwayi ahu we bilie, me dika okwu onye nke Chineke si di: ọ we je, ya onwe-ya na ulo-ya, nọ dika ọbìa n'ala ndi Filistia arọ asa.


O we kpọ oké unwu ka ọ biakwasi ala ahu; Nkpa-n'aka nile, bú achicha, ka Ọ kpajiri.


Ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú, Site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme.


N'ihi na, le, ọ bu n'obodo ahu nke akpọkwasiri aham ka Mu onwem nāmalite ime ihe ọjọ, ma unu onwe-unu, ùnu gābu ndi anāmaghi ikpe ma-ọli? Unu agaghi-abu ndi anāmaghi ikpe: n'ihi na mma-agha ka Mu onwem nākpọ ka ọ dakwasi ndi nile bi n'uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.


Mb͕e M'gākpajiri unu nkpa-n'aka-unu, bú achicha, ndinyom iri gēsi achicha-unu n'otù ite-ọku, ha gēweghachi kwa achicha-unu n'ọtùtù: unu gēri kwa, ma afọ agaghi-eju unu.


Mu onwem kwa, enyewom unu ezé nwuru enwu n'obodo nile unu, na ukọ nri n'ebe nile unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu jehova puta.


M'we kpọ oge ọkpukpọ-nku ka ọ dakwasi ala nka na ugwu-ya nile na ọka-ya na manya-vine ọhu ya na manu ọhu ya na ihe nile nke ala nēpuputa na madu na anumanu na ihe nile unu dọb͕uru onwe-unu n'ọlu inweta.


oké ala-ọma-jijiji gādi kwa, oké unwu na ajọ ọria nēfe efe gādi kwa n'ebe di iche iche; ihe di egwu na ihe-iriba-ama uku gādi kwa site n'elu-igwe.


N'ihi na ndia bu ubọchi nkpeputa, ka ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu.


Ma n'ezie ka M'nāsi unu, Ọtutu ndinyom di-ha nwuru di n'ala Israel n'ubọchi Elaija, mb͕e emechiri elu-igwe arọ atọ na ọnwa isi, mb͕e oké unwu dara n'ala ahu nile;


Ma otù onye nime ha, aha-ya bu Agabọs, biliri, we gosi site na Mọ Nsọ na oké unwu gaje ida n'elu-uwa dum madu bi: nke putara n'oge Klọdiọs.


O rue, na mb͕e ndi-ikpe n=ekpe, na ok/e unwu di n>ala. Ot#u nwoke nke Bet-lehem-juda we je inọ dika ọb#ia n>ala-ọhia Moab, ya onwe-ya, na nwunye-ya, na umu-ya ndikom abua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan