Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 7:20 - Bible Nso

20 o we diri ya otú a; ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n'ọnu-uzọ-ama, ọ nwua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Ọ bụkwa otu a ka o si mee, nʼihi na ndị mmadụ zọgburu ya nʼụkwụ nʼọnụ ụzọ ama, ebe ọ nọ nwụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 7:20
10 Iomraidhean Croise  

onye-isi-agha we za onye nke Chineke, si, Ma, le, ọ buru na Jehova eme window n'elu-igwe, ọ̀ gādi ka okwu a si di? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya:


Ma Elaisha gwara nwayi ahu okwu, bú onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu, si, Bilie, je, gi onwe-gi na ulo-gi, nọ dika ọbìa n'ebe ọ bula i gānọ dika ọbìa: n'ihi na Jehova akpọwo oké unwu ka ọ da: ọzọ kwa, ọ gābiakwasi ala arọ asa.


Ha we bilie n'isi-ututu, pua ba n'ọzara Tekoa: ma mb͕e ha nāpu, Jehoshafat guzoro, si, Nurunum, Juda, na ndi bi na Jerusalem; kwerenu na Jehova, bú Chineke-unu, unu gēkwesi kwa ntukwasi-obi; kwerenu na ndi-amuma-Ya, ihe gāga-kwa-ra unu nke-ọma.


Ka o rue, n'iriju afọ-ya, Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya, Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya.


abum Onye nēme ka okwu orù-Ya guzosie ike, Nke nēmezu kwa ndum-ọdu ndi-ozi-Ya; Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēbi ya; Nke nēkwu kwa okwu bayere obodo nile nke Juda, si, Agēwu ha; nkpọnkpọ-ebe-ya nile ka M'gēwuli kwa:


ọzọ, isi Efraim bu Sameria, isi Sameria bu kwa nwa Remalaia. Ọ buru na unu adighi-ekwe, n'ezie unu agaghi-ekwesi ntukwasi-obi.


Hananaia, bú onye-amuma, we nwua n'arọ ahu n'ọnwa nke-asa.


Jehova we si Moses na Eron, N'ihi na unu ekweghi na Mu, idom nsọ n'anya umu Israel, n'ihi ya unu agaghi-eme ka nkpọkọta nka ba n'ala ahu nke M'nyeworo ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan