Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 7:1 - Bible Nso

1 Elaisha we si, Nurunu okwu Jehova: otú a ka Jehova siri, Dika mb͕e a echi agēre otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, na mb͕é barley abua otù shekel, n'ọnu-uzọ-ama Sameria.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ịlaisha zara sị ya, “Nụrụ okwu Onyenwe anyị. Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Nʼoge dịka mgbe a echi, a ga-ere otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, rekwaa akpa nta ọka balị abụọ otu shekel nʼọnụ ụzọ ama obodo Sameria.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 7:1
19 Iomraidhean Croise  

Ọ si, N'ihi nka nuru okwu Jehova: ahurum Jehova ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze-Ya, na usu-ndi-agha nke elu-igwe nile ka ha nēguzo n'akuku Ya n'aka-nri-Ya na n'aka-ekpe-Ya.


Aisaia we si Hezekaia, Nuru okwu Jehova.


Ma otù nwoke siri na Beal-shalisha bia, butere onye nke Chineke achicha nke nkpuru mbu, orú ob͕e achicha barley, na ọka nke ubi n'akpa-ya. Ọ we si, Nye ndi-ayi, ka ha we rie.


Oké unwu uku we di na Sameria: ma, le, ha nānọchigide ya n'agha, rue mb͕e anēre isi inyinya-ibu ọgu ọla-ọcha anọ na otù uzọ n'uzọ anọ nke otù kab ǹsí nduru ọla-ọcha ise.


Mb͕e ọ nọ nākpayere ha uka, le, onye-ozi ahu nāridakuru ya: ọ si, Le, ihe ọjọ a sitere n'aka Jehova; gini mere m'nēle anya Jehova ọzọ?


Ndi Israel we pua, luta ọmuma-ulo-ikwū Siria n'agha. Ewe re otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, na mb͕é barley abua otù shekel, dika okwu Jehova si di.


Chineke nọ n'etiti ya; agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya: Chineke gēyere ya aka mb͕e chi bọrọ.


Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu, guzonu onwe-unu n'ebe a, hu nzọputa Jehova, nke Ọ gēmere unu ta: n'ihi na ndi Ijipt ndi unu huworo ta, unu agaghi-ahu kwa ha ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.


Anuwom ntamu nile nke umu Israel: gwa ha okwu, si, N'etiti ehihie na anyasi ka unu gēri anu, n'ututu ka unu gēriju kwa afọ na nri; unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


M'gētiye kwa nb͕aputa n'etiti ndim na ndi-gi: echi ka ihe-iriba-ama nka gādi.


Nurunu okwu Jehova, unu ndi-ikpe Sọdọm; ṅanu nti n'iwu Chineke-ayi, unu ndi Gọmọra.


O we sim, Bue amuma n'elu ọkpukpu ndia, si ha, Unu ọkpukpu kpọrọ nku, nurunu okwu Jehova.


Otù nwa-okoro ntà nọ n'ebe a, onye ji ob͕e achicha barley ise, na azù abua: ma ǹdia bu gini n'etiti ọtutu madu di otú a?


Joshua we si ndi Israel, Donu onwe-unu nsọ: n'ihi na echi ka Jehova gēme ihe-ebube di iche iche n'etiti unu.


M'we nu dika agāsi na ọ bu otu n'etiti ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Otù ọtùtù ntà nke ọkà bu otù shilling, ọtùtù ntà atọ nke barley bu otù shilling; emejọ-kwa-la manu na manya-vine.


Ha we si ndi-ozi biara, Otú a ka unu gāsi ndikom Jebesh-gilead, Echi ka nzọputa gādiri unu, mb͕e anyanwu nēkpo ọku. Ndi-ozi ahu we bia gosi ndikom Jebesh; ha we ṅuria ọṅu.


Samuel we si Sọl, Mu ka Jehova zitere ite gi manu ka i buru eze ndi-Ya, bú Israel: ma ub͕u a ge nti olu okwu Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan