Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 6:8 - Bible Nso

8 Ma eze Siria nēbuso Israel agha; o we me ka ndi-orù-ya dua ya ọdu, si, N'ebe di otú a otú a ka ọmuma-ulo-ikwūm gādi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Nʼoge a, eze ndị Aram na ndị Izrel nọ nʼagha. Mgbe ya na ndịisi agha ya kparịtachara, ọ sịrị, “Aga m eguzobe ọmụma ụlọ ikwu m nʼebe dị otu a na nʼebe dị otu a.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 6:8
13 Iomraidhean Croise  

Ma Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara usu-ndi-agha-ya nile: orú ndi-eze na iri na abua soro kwa ya, ha na inyinya na ub͕ọ-ala: o we rigo, nọchigide Sameria n'agha, buso ya agha.


Ma ndi-orù eze Siria siri ya, Chi ukwu ka chi-ha bu; n'ihi ya ka ha di ike kari ayi: ma otú ọ di, ka ayi buso ha agha n'ala di lari, ayi aghaghi kwa idi ike kari ha.


Ben-hedad we si ya, Obodo nile nke nnam nara n'aka nna-gi, m'gēnyeghachi gi ha; i gākwa-kwa-ra onwe-gi amá nime Damaskọs, dika nnam kwara nime Sameria. Ma mu onwem, ka Ehab kwuru, n'ọb͕ub͕a-ndu nka ka m'gēzilaga gi. Ya na ya we b͕a ndu, o we zilaga ya.


Ha we nọdu arọ atọ agha adighi n'etiti Siria na Israel.


Ma eze Siria nyere orú ndi-isi na iri na abua nke ub͕ọ-ala o nwere iwu, si, Unu ebusola onye ntà ma-ọbu onye uku agha, kama ọ bu eze Israel, nání ya.


O rue, mb͕e nka gasiri, na Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, rigo, nọchigide Sameria n'agha.


O si, Weliere onwe-gi. O we setia aka-ya, were ya.


Onye nke Chineke we zigara eze Israel ozi, si, Lezie onwe-gi anya, ka i ghara igabiga ebe ahu; n'ihi na n'ebe ahu ka Siria nāridata.


Èchìchè nile nēji ndum-ọdu guzosi ike: Gi were kwa ezi ndum-ọdu bue agha.


Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.


Duritanu onwe-unu ọdu, ma agēmebi ya; kwuenu okwu, ma ọ gaghi-eguzosi ike: n'ihi na Chineke nọyere ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan