2 Ndị Eze 6:32 - Bible Nso32 Ma Elaisha nānọdu n'ulo-ya, ndi-okenye nānọdu kwa n'ebe ọ nọ: eze we ziga otù nwoke site n'iru ya: ma tutu onye-ozi ahu abiakute ya, ya onwe-ya siri ndi-okenye, Ùnu ahuwo na nwa ob͕u-madu a ezitewo iwezuga isim? hunu, mb͕e onye-ozi ahu nābia, mechienu uzọ, were ibo-uzọ kwagide ya: òlu ukwu abua nke onye-nwe-ya adighi n'azu ya? Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a32 Nʼoge a, Ịlaisha nọdụrụ ala nʼụlọ ya, ndị okenye sokwa ya nọdụ. Eze zipụrụ onyeozi, ma tupu o rute, Ịlaisha gwara ndị okenye ahụ okwu sị ha, “Unu ahụla na ogbu mmadụ a ezitela mmadụ ka ọ bịa gbupụ m isi. Mgbe onyeozi ya bịaruru, mechienụ ụzọ hapụ ya nʼezi, nʼihi na eze nʼonwe ya ga-eso ya nʼazụ bịa.” Faic an caibideil |