Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 6:32 - Bible Nso

32 Ma Elaisha nānọdu n'ulo-ya, ndi-okenye nānọdu kwa n'ebe ọ nọ: eze we ziga otù nwoke site n'iru ya: ma tutu onye-ozi ahu abiakute ya, ya onwe-ya siri ndi-okenye, Ùnu ahuwo na nwa ob͕u-madu a ezitewo iwezuga isim? hunu, mb͕e onye-ozi ahu nābia, mechienu uzọ, were ibo-uzọ kwagide ya: òlu ukwu abua nke onye-nwe-ya adighi n'azu ya?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Nʼoge a, Ịlaisha nọdụrụ ala nʼụlọ ya, ndị okenye sokwa ya nọdụ. Eze zipụrụ onyeozi, ma tupu o rute, Ịlaisha gwara ndị okenye ahụ okwu sị ha, “Unu ahụla na ogbu mmadụ a ezitela mmadụ ka ọ bịa gbupụ m isi. Mgbe onyeozi ya bịaruru, mechienụ ụzọ hapụ ya nʼezi, nʼihi na eze nʼonwe ya ga-eso ya nʼazụ bịa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 6:32
16 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e Ahaija nuru olu ukwu-ya ka ha nāzọ, mb͕e ọ nābata n'ọnu-uzọ, na ọ siri, Bata, nwunye Jeroboam; n'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nēme onwe-gi dika onye ala ọzọ? ma mu onwem bu onye-ozi siri ike n'ebe i nọ.


o we rue, mb͕e Jezebel bipuru ndi-amuma Jehova, na Obadaia chiri ọgu ndi-amuma ise, zo ha, ọgu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha.)


me-kwa-nu ka ndikom abua, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, nọdu n'iru ya, ka ha b͕a kwa àmà megide ya, si, I b͕akutere Chineke na eze azu. Me-kwa-nu ka ọ pua, werenu nkume tub͕ue ya, ka ọ nwua.


Ndikom abua ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we bata, nọdu n'iru ya: ndikom ahu ndi jọb͕uru onwe-ha we b͕a àmà megide ya, bú Nebot, n'iru ndi Israel, si, Nebot b͕akutere Chineke na eze azu. Ha we me ka ọ pua rue azu obodo, ha were nkume tub͕ue ya, o we nwua.


Ma i gāgwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ì b͕uwo ọchu, nweta kwa? I gāgwa kwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ebe nkita rachara ọbara Nebot ka nkita gāracha ọbara-gi, ọbuná nke gi onwe-gi.


Ọ si ya, Òbim ejesoghi gi, mb͕e nwoke ahu siri n'ub͕ọ-ala-ya chigharia izute gi? ọ̀ bu mb͕e inara ego, na inara uwe, na ubi-olive na ubi-vine, na ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ndi-orù ndikom na ndinyom nēje ozi?


Otù onye nime ndi-orù-ya we si, É-è, onye-nwem eze: kama Elaisha, bú onye-amuma nke nọ n'Israel, o nēgosi eze Israel okwu nile nke i nēkwu n'ime-ulo-ndina-gi.


Eze we me ka onye-isi-agha ahu, bú onye ọ nādabere n'aka-ya, lekọta ọnu-uzọ-ama: ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n'ọnu-uzọ-ama, ọ nwua dika onye nke Chineke kwuru, onye kwuru mb͕e eze ridakuru ya.


Jehova me-kwa-ram ka m'mara ya, m'we mara ya: mb͕e ahu ka I mere ka m'hu omume nile ha.


N'ihi na Zedekaia, bú eze Juda, b͕ochibidoro ya-ri, si, Gini mere gi onwe-gi ji ebu amuma, si, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēwere kwa ya;


Ufọdu nime ndi-okenye Israel we biakutem, nọdu ala n'irum.


O rue n'arọ nke-asa, n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na ufọdu nime ndi-okenye Israel biara iju Jehova ase, ha we nọdu ala n'irum.


Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.


O rue, n'arọ nke-isi, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nānọdu ala n'ulom, mb͕e ndi-okenye Juda nānọdu kwa ala n'irum, na aka Onye-nwe-ayi Jehova dakwasirim n'ebe ahu.


O we si ha, Ganu, si nkita-ọhia ahu, Le, anamachupu ndi-mọ ọjọ, nāluzu kwa ọlu ime ka aru di madu ike ta na echi, n'ubọchi nke-atọ emekwam ka M'zu okè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan