Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 6:25 - Bible Nso

25 Oké unwu uku we di na Sameria: ma, le, ha nānọchigide ya n'agha, rue mb͕e anēre isi inyinya-ibu ọgu ọla-ọcha anọ na otù uzọ n'uzọ anọ nke otù kab ǹsí nduru ọla-ọcha ise.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Nʼihi nke a, oke ụnwụ dara nʼobodo Sameria. Nri kọrọ nʼala ahụ ruo na e bidoro ire otu isi ịnyịnya ibu iri shekel ọlaọcha asatọ. E rekwara nsị nduru shekel ise.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 6:25
14 Iomraidhean Croise  

Agu we nāgu ala Ijipt nile, ndi ala ahu we tikue Fero inye ha nri: Fero we si ndi Ijipt nile, Jekurunu Josef, ihe ọ si unu me, menu ya.


Elaija we je ime ka Ehab hu ya anya. Ma oké unwu ahu siri ike na Sameria.


N'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa nke-anọ oké unwu siri ike n'obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere.


O rue, mb͕e eze Israel nāgabiga n'elu mb͕idi, na otù nwayi tikuru ya nkpu, si, Zọputa, onye-nwem eze.


Eze we bilie n'abali, si ndi-orù-ya, Biko, ka m'gosi unu ihe Siria meworo ayi. Ha mara na agu nāgu ayi onwe-ayi, ha we si n'ọmuma-ulo-ikwū-ha pua izo onwe-ha n'ọhia, si, Mb͕e ha siri n'obodo puta, ayi gējide ha na ndu, ba n'obodo-ha.


Ọ buru na ayi asi, Ayi gābà n'obodo, oké unwu di kwa n'obodo, ayi gānwu kwa n'ebe ahu: ọ buru kwa na ayi anọdu n'ebe a, ayi gānwu kwa. Ma ub͕u a, bianu, ka ayi dabà n'ọmuma-ulo-ikwū Siria: ọ buru na ha edebe ayi ndu, ayi gādi ndu; ọ buru kwa na ha eme ka ayi nwua, ayi gānwu kwa.


Ọ buru na apuam je n'ọhia, le, ndi ejiworo mma-agha b͕u! ma ọ buru na abàm n'obodo a, le, ndi nāria ọria site n'oké unwu! n'ihi na ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà, ha akpaghariwo n'ala, ma ha amaghi ihe.


Le, obo-ihe ndia atuliri atuli, ha abiaruwo obodo a iwere ya; enyewo kwa obodo a n'aka ndi Kaldea ndi nēbuso ya agha, n'ihi mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe: ihe I kwuworo erèwo kwa; ma, le, I nāhu ya.


N'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa ahu, oké unwu siri ike n'obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere.


ka nri na miri we kọ ha, ka o we ju kwa ha anya, otù onye n'aru ibe-ya, ha ewe ta aru n'ajọ omume-ha.


Mb͕e M'gākpajiri unu nkpa-n'aka-unu, bú achicha, ndinyom iri gēsi achicha-unu n'otù ite-ọku, ha gēweghachi kwa achicha-unu n'ọtùtù: unu gēri kwa, ma afọ agaghi-eju unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan