Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 6:10 - Bible Nso

10 Eze Israel we ziga ozi n'ebe ahu nke onye nke Chineke siri ya dọ kwa ya aka na nti bayere ya; ewe debe ya ndu n'ebe ahu, ọ bughi otù ub͕ò, ọ bughi kwa ub͕ò abua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Nʼihi nke a, eze Izrel mere nchọpụta banyere ebe ahụ onye nke Chineke gwara ya. Ọtụtụ mgbe Ịlaisha dọrọ eze aka na ntị, nʼihi ya, ha nọrọ na nche nʼebe ahụ niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 6:10
17 Iomraidhean Croise  

O we gukọta umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, ha we di ọgu iri-na-otù na iri na abua: mb͕e agukọtasiri ha ọ gukọta ndi-ya nile, bú umu Israel nile, nnù iri-na-asa na ọgu iri.


Ma Elaisha nāria ọria nke ọria-ya ahu nke ọ nwuru nime ya: Joash, bú eze Israel, we ridakuru ya, kwa ákwá n'iru ya, si, Nnam, nnam, ub͕ọ-ala Israel, na ndi-inyinya-ya!


Ma Elaisha nēle ya anya; ya onwe-ya nēti kwa nkpu, si, Nnam, nnam, ub͕ọ-ala Israel, na ndi-inyinya-ya! ma ọ hughi ya ọzọ: o we jide uwe nke aka ya, dọwa ha ibe abua.


O we rida, suye onwe-ya nime Jọdan ub͕ò asa, dika okwu onye nke Chineke si di: anu-aru-ya we laghachi dika anu-aru nwa-okoro ntà, o we di ọcha.


Ma obi eze Siria anọghi n'otù ebe n'ihi ihe a; o we kpọ ndi-orù-ya, si ha, Ùnu agaghi-egosim onye nime ayi diri eze Israel?


Onye nke Chineke we zigara eze Israel ozi, si, Lezie onwe-gi anya, ka i ghara igabiga ebe ahu; n'ihi na n'ebe ahu ka Siria nāridata.


Ha we bilie n'isi-ututu, pua ba n'ọzara Tekoa: ma mb͕e ha nāpu, Jehoshafat guzoro, si, Nurunum, Juda, na ndi bi na Jerusalem; kwerenu na Jehova, bú Chineke-unu, unu gēkwesi kwa ntukwasi-obi; kwerenu na ndi-amuma-Ya, ihe gāga-kwa-ra unu nke-ọma.


Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya: Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra.


Jehova me-kwa-ram ka m'mara ya, m'we mara ya: mb͕e ahu ka I mere ka m'hu omume nile ha.


Ebe Chineke duru ha ọdú na nrọ ka ha ghara ilaghachi jekuru Herod, ha we wezuga onwe-ha ga ala-ha site n'uzọ ọzọ.


Ma mb͕e ọ huru ọtutu madu nime ndi-Farisi na ndi-Sadusi ka ha nābia baptism-ya, ọ siri ha, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia?


si, Atula egwu, Pọl; i ghaghi iguzo n'iru Sisa: le kwa, Chineke ewerewo amara nye gi ndi nile gi na ha nānọ n'ub͕ọ.


Noa, mb͕e Chineke dusiri ya ọdu bayere ihe akāhughi anya rue oge ahu, ebe ọ turu egwu Chineke, ọ bu okwukwe ka o ji dozie ub͕ọ izọputa èzí-na-ulo-Ya; o site-kwa-ra na nka ma uwa ikpé, we ghọ onye-nketa nke ezi omume ahu nke di n'uzọ okwukwe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan