Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 5:8 - Bible Nso

8 O rue, mb͕e Elaisha bú onye nke Chineke, nuru na eze Israel dọwara uwe-ya nile, o we zigara eze ozi, si, N'ìhi gini ka i dọwara uwe-gi nile? biko, ka ọ biakutem, ọ gāmara kwa na onye-amuma di n'Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Mgbe Ịlaisha onye Chineke nụrụ na eze Izrel dọwara uwe ya, o ziri ozi a zigara ya sị, “Gịnị mere i ji dọwaa uwe gị? Zitere m Neeman. Ọ ga-amatakwa na e nwere onye amụma nʼIzrel.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 5:8
14 Iomraidhean Croise  

Devid we si Joab, si kwa ndi nile ya na ha nọ, Dọwanu uwe-unu, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tie aka n'obi n'iru Abnea. Eze, bú Devid, nējeso kwa ihe eji ebu ozu.


Okwu Chineke we rue Shemaia nti, bú onye nke Chineke, si,


Nwayi ahu we si Elaija, Ub͕u a amawom nka na onye nke Chineke ka i bu, na okwu Jehova bu kwa ezi-okwu n'ọnu-gi.


Ha si ya, Otù nwoke rigotara izute ayi, ọ si ayi, Jenu, laghachikuru eze nke zìri unu, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel na gi onwe-gi nēziga iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase? n'ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu.


O we laghachikute onye nke Chineke, ya onwe-ya na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, bia, guzo n'iru ya, si, Biko, le, amawom na ọ dighi Chineke di n'uwa nile, ọ bu nání n'Israel: ma ub͕u a, biko, nara ihe-ngọzi n'aka orù-gi.


Ọ si nwayi-nwe-ya, Ọ gādim nọ̄ nma, ma asi na onye-nwem nọ n'iru onye-amuma nke nọ na Sameria! mb͕e ahu ọ gēme ka o si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta.


O rue, mb͕e eze Israel guru akwukwọ ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ọ̀ bu Chineke ka m'bu, ime ka madu nwua na ime ka madu di ndu, na nwoke a nēziterem ozi ime ka nwoke si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta? ma otú ọ di, biko, maranu hu kwa na ya onwe-ya nāchọ uzọ isi megidem.


Neaman we bia, ya na inyinya-ya nile na ub͕ọ-ala-ya, o guzo n'ọnu-uzọ ulo Elaisha nwere.


Ndi-orù-gi ndia nile gārida-kutem, kpọ isi ala nyem, si, Pua, gi onwe-gi, na ndi nile nke nọ n'ukwu-gi: emesia m'gāpu. Ọ we si n'ebe Fero nọ pua n'iwe di ọku.


Ma ha onwe-ha, ma ha gānu, ma ha gāghara, (n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu,) ha gāmara na onye-amuma anọwo n'etiti ha.


Ọ bu kwa onye-amuma ka Jehova jiri me ka Israel si n'Ijipt rigoputa, ọ bu kwa onye-amuma ka ejiri debe ya.


Ma ọ bu unu ndi mba ọzọ ka m'nāgwa okwu, (n'ezie, ka ọ ra, bú onye-ozi nke ndi mba ọzọ mu onwem bu, anamenye ije-ozim otuto):


O we si ya, Biko, le, onye nke Chineke nọ n'obodo a, anāsọpuru kwa nwoke ahu; ihe nile ọ nēkwu aghaghi irè erè: ub͕u a ka ayi je n'ebe ahu; eleghi anya ọ gēgosi ayi uzọ-ayi nke ayi jeworo na ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan