Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 5:16 - Bible Nso

16 Ọ si, Jehova nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, m'gaghi-anara ihe ọ bula ma-ọli. O we rugide ya inara ya; ma ọ juru aju.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye m na-ejere ozi, agaghị m ana gị ihe ọbụla.” Ma Neeman rịọrọ ya arịrịọ ka ọ nara ya, ma ọ jụrụ ajụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 5:16
15 Iomraidhean Croise  

Onye nke Chineke ahu we si eze, Ọ buru na i nyem nkera ulo-gi, m'gaghi-esoro gi ba, m'gaghi-eri kwa nri, m'gaghi-aṅu kwa miri n'ebe a:


Elaija, bu onye Tisbe, onye sitere na ndi-nnọdu nke Gilead, we si Ehab, Jehova, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agaghi-adi ma-ọli n'arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di.


Elaija we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, n'ezie ta ka m'gēme ka ọ hum anya.


Elaisha we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, n'ezie, ọ buru na ahughm Jehoshafat, bú eze Juda, iru-ọma, m'gaghi-elegide anya n'ebe i nọ ma-ọli, m'gaghi-ahu kwa gi anya ma-ọli.


Ma Gihezi, bú nwa-okorọbia Elaisha onye nke Chineke, siri, Le, onye-nwem eb͕ochiwo onwe-ya n'ebe Neaman onye Siria nka nọ, n'ighara inara n'aka-ya ihe o wetara: Jehova nādi ndu, n'ezie m'gāb͕aso ya, nara ihe ufọdu n'aka-ya.


Ọ si ya, Òbim ejesoghi gi, mb͕e nwoke ahu siri n'ub͕ọ-ala-ya chigharia izute gi? ọ̀ bu mb͕e inara ego, na inara uwe, na ubi-olive na ubi-vine, na ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ndi-orù ndikom na ndinyom nēje ozi?


Daniel zara, si n'iru eze, Ka onyinye-gi diri gi onwe-gi, gi nye kwa onye ọzọ ugwọ-ọlu-gi; ma m'gāguru eze ihe a edere, me ka ọ mara isi-ya.


Menu ndi aru-ha nādighi ike ka aru di ha ike, menu ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, menu ndi-ekpenta ka ha di ọcha, chupunu ndi-mọ ọjọ: n'efu ka unu natara, nyenu n'efu.


Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nābaram urù. Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ dighi ihe ọ bula gāchi mu onwem.


Le, nka bu ub͕ò nke-atọ m'nọ dika onye edoziworo ibiakute unu; m'gaghi-abu kwa ibu arọ́: n'ihi na achọghi m ihe-unu, kama ọ bu unu onwe-unu: n'ihi na ọ bughi ọlu umu ikpadoro ndi muru ha ihe, kama ọ bu ọlu ndi muru umu ikpadoro umu-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan